2019 Elections: Ihe ndị mmadụ na-ekwu maka ozi Buhari na Atiku

Ebe foto si, Getty Images
Site mgbe ndị ji ọkọlọtọ paatị abụọ kachasị na Naịjirịa ugbua bụ Muhammadu Buhari (APC) na Atiku Abubakar (PDP) zipuru ọzị ibido ịchụ nta vootu, social media na Naịjirịa na-eke ọkụ.
Ọtụtụ n'ime ha na-ekwusi ike na ha ga-akwado ha nke ukwu mana ọtụtụ n'ime ha na-agba ajụjụ na o nwere uru ga-apụta na nkwado ha abụọ makana ha chịala Naịjịrịa dịka onyeisiala na osote onyeisiala.
Ihe ndị mmadụ dere na Twitter
@Abstopsy rịọrọ Atiku ka ọ gba mbo hụ na ogbugbu mmadụ na-eme n'ugwu Awụsa kwụsịrị kpam kpam.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Imhons n'ime ozi ya dere na ọ bụ eziokwu na Atiku azaghị ọtụtụ ajụjụ ndị mmadụ na-ajụ gọmentị ugbua mana ozi ya na-egosi na ọ ga-edu Naịjirịa gawa elu ka ndị ndị mmadụ siri chọ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Mana @UmarKani na-ebo ebubo na Atiku ga-ezu akụ Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@Abdoulmaleek kele osote onyeisiala maka ihe mmere na ndụ ụmụakwụkwọ ala.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Mana Mon Chere dere na Buhari ga-eburu ụmụ Naịjirịa si ugwu na-agbada.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Ozi Atiku
Atiku agụpụtala ihe ọ ga-emere ndị Naịjirịa ma ọbụrụ na-enye ya ọchịchị n'afọ 2019.
Atiku bụ onye kere okwu ya ịchafụ na Facebook nke o mere n'ehihie Mọnde gụpụtara ihe ndị a n'okwu ya.
1. Gọọmentị anyị ga-enye ọrụ gbanyụụ
Anyị ga-eme nke a site na ime ka ndị ọrụaka a kpọrọ SME na bekee nke ruru nde iri na ise (50) kulie na Naịjirịa
Ụlọọrụ ọrụaka ndị a ga-eme ka GDP Naịjirịa toruo njeri dọla 900 n'afọ 2025.
Nke a ga-enye mmadụ ruru puku abụọ na ise (2.5) ọrụ kwaa afọ.
Ndị a ga-azụkwa ihe ruru nde mmadụ n'ọrụ kwa afọ.
2. Anyị ga-ewepụta ego mgbazinye maka ndị ọrụaka
Ego mgbazinye a ga-enye aka ime ka ndị ọrụaka nwete ego ha ga-eji achụ nta ego.
Amụma anyi ịhazigharị Naịjirịa ga-eme ka akụnaụba steeti na gọọmenti etiti mụbawanye.
3. Steeti ọbụla ga-enweta oke ọ rụtara.
3. Anyị ga-akwụ ndị ọrụ oyibo ụgwọ ga-ezuru ha ị gbo mkpa ezinaụlọ.
4. Anyị ga-eme ka ụmụakwụkwọ nwete agụm akwụkwọ bụ ọkacha akacha na mba ụwa
5. Anyị ga-enye ndị nne ahụike tọrọatọ ma mekwa ka akụ na ụba ha mụbawanye.
6. Gọọmenti anyi ga-emekwa ka ndị rụchara ọrụ bekee ghara iji egwu laa ezumike nka.
7. Anyị ga-etinyekwa ego na ịrụgharị ihe eji enyere ndụ aka dịka okporoụzọ, ọkụ na mmiri.
Atiku sị na ihe ndị a abụghị nkwa ọnụefu kama ọ bụ atụmatụ ha ga-abado ma ha banye n'ọchịchị.

Ebe foto si, Getty Images
N'aka ọzọ Onyeisiala Mohammadu Buharị kwere nkwa ndị
1. Anyị ga-ahazigharị agụmakwụkwọ
Anyị ga-arụgharị ụlọakwụkwọ dị 10,000 kwa afọ ma zụgharịa ndị nkuzi n ikuzi sayensi, teknụzụ, nka, mgbakọ na mwepụ
2. Rutọpụ akwa mmiri nakwa ọkporoụzọ
Ha kwere nkwa ịrụpọ akwammiri Naija nke abụọ
3. Anyị ga-aga n'ihu ibu agha megide nrụrụaka
4. N'agbanyeghị oko anyị nwara n'imechi ụzọ , ọrụ ka dị n'ịhụ na nrụrụaka n'ala anyị
5. Anyị ga-emepe ohere ọrụọhụrụ rụrụ nde 15
N'ịganihu, ebe anyị ka etinye aka na ya bụ ọrụ site na ịmụba atụmatụ N-Power nakwa ọrụugbo na ndị ọrụaka.
I nye ndị ọrụ ugbo na ndị na-ere ihe ọrụ site na mbuli ụmụakwụkwọ gọọmentị na-enye nrị site na nde 9.2 rue nde 15
6. Inye ịntanet n'efu na ebe ụfọdụ
Ha na Google ga ejikọrịta aka ime ka enwe ịnaneti na efu n'ụlọakwụkwọ, ụlọọgwụ nakwa ahịaMana nkwa ndị kpalitere iwe ụfọdụ ụmụ Naijiria.
7. A ga-enye ụmụnwaanyị ọkwa ruru pasent 35
A ga-enye kwa ndị ntorobịa ọkwa na gọọmentị
8. Atụmatụ ahụike maka mmadụ niile
9. 11,000 megawat ọkụ latrik
I welite ọkụ latrik megawat 1000 kwa afọ ganye na o rue megawati 11,000.
10. imepe ụlọakụ ọha
Ihiwe ụlọakọ ga na-agbazinye ndị ahịa na ndị ọrụaka obere ego mgbazinye ruru otu nde naira.
Ihe ndị mmadụ kwuru na soshal midia
Ha na-ajụ Buhari na APC ihe mere nkwa mbụ ha kweburu.











