World Cup 2018: Falcons na-ekpere Super Eagles ekpere

Aha onyonyo, Oparanozie: Anyị na-ekpere Super Eagles ekpere

Nwa agbọghọ na-agbara Super Falcons bọọlụ bụ Ugochi Desire Oparanozie ekwupụtala nkwado ya n'ebe ndị Super Eagles nọ.

Na ngwụcha asọmpi ha na ndị Gambia ụnyaahụ ebe ha ji ọkpụ goolu isii a na-asataghị otu merie, Oparanozie gwara BBC Igbo na obi dị ya ụtọ inye goolu anọ n'ime egwuregwu ahụ.

Ọ gara n'ihu kwuo na ọ maara na ndị Super Eagles ga-eme nkeọma n'asọmpi Iko Mbaụwa.

Oparanozie kpeere ndị Super Eagles ekpere ọganihu.

Naịjirịa ji nchịkọta ọkpụ asaa asataghị otu merie ndị Gambia iji tozuo oke n'asọmpi Iko mba Afrịka a ga-agba na Ghana n'afọ a.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ