Gịnị mere bọọlụ ụmụnwaanyị anaghị aga ahịa na Naịjirịa?

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
Egwuregwu bọọlụ bụ egwuregwu nwere ọtụtụ mmadụ ọ na-amasị na Nịjirịa na kwa n'ụwa niile.
Ugbua, asọmpị iko mba ụwa bụ nke na-akpọtụ akpọtụ nke ọma makana ọ ga-ebido n'ụbọchị atọ na-abịa, mana ajụjụ anyị na-ajụ n'akụkọ a bụ: gịnị mere egwuregwu bọọlụ gbasara ụmụnwanyị anaghị enwe mmasị dịka o kwesiri ị nwe?
Ka anyị leebe anya n'otu Super Falcons.
Taa, Super Falcons meriri Queen Scorpions nke Gambia ọkpụ isii na asataghị ihe n'agba nke abụọ n'itozu n'isonye n'asọmpi iko mba Afrịka nke ụmụnwaanyị.

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
Cheta kwa na Falcons ebuliela iko a ugboro iri kamgbe e ji malite emume a.
Mana ruo ugbua, ọtụtụ mmadụ anaghị e kiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị dịka a esịrị tụ anya.
BBC Igbo jụrụ ndị bọọlụ na-amasị ajụjụ ọnụ gbasara okwu a.
Gịnị mere ọtụtụ mmadụ anaghị ekiri bọọlụ ụmụnwaanyị?
Chisom Mbonu-Ezeoke bụ nwaanyị egwuregwu bọọlụ na-amasị nke ọma. O kwuru na ọ bụ makana gọọmentị anaghị etinye ego n'egwuregwu a.

Ebe foto si, @NGSuper_Falcons
O kwukwara na ndị ntaakụkọ anaghị agbasa ozi gbasara egwuregwu bọọlụ nke ụmụnwaanyi ka ha kwesiri ịme.
Mana Kenneth Umerue kwuru na ọtụtụ ụmụnwoke anaghị ekiri egwuregwu bọọlụ ụmụnwaanyị makana n'ụche a egwuregwu a bụ nke nwoke.
Umerue kwuru na "Ndị bekee kpọrọ ihe a 'Gender Issues'".
Mana Mbonu-Ezeoke ekwetaghị n'okwu nke a. O kwuru na "ị lee anya oge ọbụla ndị Super Falcons na-agba agba nke ịkpeazụ, ọgbọ egwuregwu na-eju gbọm!. Nke a gosiri na egwuregwu a na-amasị ọtụtụ ndị mmadụ"
Stephen Mbonu kwetala na ihe a Mbonu-Ezeoke kwuru, mana ọ dọrọ aka na ntị sị: "oge eruola ịchọpụta ọtụtụ ụmụnwanyị nwere ike ị gba bọọlụ ọfụma ọfụma. Ihe a ga-eme ka mmasị egwuregwu a na-eto oge ọbụla."

Akụkọ ga-amasi gị:










