Amabeghị ezinaụlo ndị nwụrụ na mberede mere n'ụzọ Onicha - Uweojii
Ndi uweojii ekwuola na ma maka mmadụ asatọ, asaa n'ime ha echere na ha bụ ndi otu ezinaụlọ nwụrụ n'ihe mberede okporoụzọ n'Ugwuonyeama nke ụzọ Enugwu-Onicha. Mmadụ anọ merụrụ ahụ mgbe ihe mere n'ụbọchị 10 nke ọnwa Juun nke afọ a.
Ihe mberede a mere n'elekere iri na otu nke ụtụtụ gburu ndị niile n'eme njem n'ime obele ụgbọla dịka otu ụgbọala bu ndị njem ọzọ sọbara isi n'ụgbọala nke ha.
BBC Igbo kpọrọ ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Enugwu bụ Ebere Amaraizu n'ekwentị, o kwuru na nke a bụ ihe mere eme.
Amaraizu kwuru na amatabeghị ndị nwee ma ọ bụ ndị ụmụnne ezinaụlọ mmadụ asaa ndị a nwụrụ anwụ.
Ndị mmadu nakwa ede maka ihe a mere na soshal midia.
O kwuru na onweghị onye kwurula na ndị a bụ ụmụnne ha, kama na nyocha ka na-aga n'ihu ị mata etu ihe a jiri mee.
Gere ihe Amaraizu kwuru n'elu;

Akụkọ ndị ga-amasị gị:







