Ndị ndu South na Middle Belt: Wepụ onyeisi INEC

Mahmood Yakubu

Ebe foto si, Inec Official Instagram

Nkọwa foto, Mahmood Yakubu were oche dịka onyeisi Inec n'afọ 2015

Ndị ndu mpaghara ndịda, etiti nakwa ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ekwuola na egwu na-atụ ha ụlọọrụ INEC agaghị a hazi ntuliaka ziri ezi n'afọ 2019.

Ha rụtụrụ aka n'oke ịkpa oke na imelara ndị ikwu nke ọchịchị a bụ ihe juputara n'ụlọọrụ a.

Ndị ndu a kpọrọ oku ka e wepụ onyeisi ụlọọrụ INEC bụ Mahmood Yakubu, kwuo na enwere ihe ndị na-egosi na ọ chọrọ ịrụrụ aka na ntuliaka i ji nye onyeisiala Buhari mmeri.

Ndị ndu tinyere ọnụ n'okwu a gụnyere Edwin Clark na Nkanga Idongesit ndị si ndịda, Ayo Adebanjo nke ọdịdị anyanwụ, Chukwuemeka Ezeife nke ọwụwa anyanwụ nakwa Dan Suleiman nke etiti Naịjirịa.

Buhari na Yakubu

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Buhari duru Yakubu n'iyi ọrụ n'ọnwa ọktoba afọ 2015

Onyeisi otu Pan Niger Delta bụ Nkanga Idongesit kwuputara mkpebi ndị ndu a ma kwuo na ndị isi ndị agha Naịjirịa ekwesila ịla ezumike nka mana ha nọ n'ọrụ ugbu a.

O kwuru na ndị a niile na-arụ ọrụ n'otu ụzọ ma ọ bụ nke ọzọ i ji mee ka obi dị onyeisiala bụ Mohammadu Buhari mma.

Idongesit kwuru site n'afọ 1960 rue ugbu a, na ọ bụ naanị Buhari nyerela onye si n'agbụrụ ya ọrụ dịka onyeisi ụlọọrụ na-ahụ maka ntuliaka.

Ndị otu a gara n'ihu kwuo ka onyeisiala nwụchie ndị Fulani na-achị ehi maka ogbugbu ha na-egbu ndị mmadụ na Naịjirịa ma hapụ ikpuchi ha.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ