Buhari ewepụtala usoro a ga-eji nye Abiola nturu ugo

Ebe foto si, Muhammadu Buhari/ Facebook
Ụlọọrụ odeakwụkwọ gọọmenti Naịjirịa ewepụtala akwụkwọ gosiri etu a ga-esi nye nwaafọ Naịjirịa a ma ama laara mmụọ bụ Moshood Abiola na onye ọkaikpe a ma ama bụ Gani Fawehinmi na onye ndọrọndọro ọchịchị Babagana Kingibe nturu ugo nke gọọmenti etiti.
N'akwụkwọ ozi ahụ odeakwụkwọ Boss Mustapha dere, o kwuru onyeisiala Muhammadu Buhari ga-enye ndị ahụ nturu ugo n'ọnwụ.
Nturu ugo a ga-enye ha
- Nturu ugo MKO Abiola ga-abụ GCFR nke bụ nturu ugo kachasị na Naịjirịa nke naanị onye bụrụla onyeisiala na-enwe
- A ga-enye Gani Fawehinmi nturu ugo GCON: Nturu ugo nke a na-eso nke onyeisala
- A ga-enyekwa Babagana Kingibe otu GCON.
Akwụkwọ odeakwụkwọ dere kwuru na a ga-eme nturu ugo ahụ ụbọchị ọhụrụ onyeisiala Buhari kwuru na a ga na-emezi ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya bụ n'ụbọchị Juune 12.
Cheta na a na-ekwu na MKO Abiola meriri ntuliaka e mere ụbochị Juunu 12 afọ 1993, ntuliak mbụ e mere kamgbe ndị agha kwaturu ọchịchị n'afọ 1983.
Mana a kagburu ya bụ ntuiaka n'ọchịchị Ibrahim Babangida.
Nturu ugo a bụ agbanyeghi na ụfọdụ ndị ọkaiwu na-agbagha onyeisiala maka mkpebi inye ha nturu ugo ahụ.









