Juun 12: FFK, Fayose, nwa Abiola kwadoro ihe Buhari mere

Moshood Abiola

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, MKO Abiola bụ onye e chere na o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Amaghị ha dịka ndị enyi onyeisiala Muhammadu Buhari, mana aka na-achị Ekiti steeti bụ Gọvanọ Ayo Fayose na onye bụbu Mịnịsta na-ahụ maka njem ụgbọelu bụ Fani Kayode kwadoro mgbanwe Buhari mere ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya.

Ụbọchị Wenesde bụ Juun 6 2018, Gọọmenti etiti Buhari nọ n'isi ya higharịrị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya site na Mee 29 ga Juun 12 iji kwanyere MKO Abiola bụ onye e chere na o meriri na ntuliaka ọkwa onyeisiala na Juun 12 nke afọ 1993 ugwu.

Fani-Kayode toro Buhari maka nke a sị "A na m ekele Buhari maka ịma ọkwa na Juun 12 bụzị ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ. "

Fani-Kayode

Ebe foto si, @realFFK

Nkọwa foto, Ihe gbasara Buhari na ọchịchị ya anaghị amasị Fani-Kayode

O kwuru: "Ihe a bụ ihe kwesịrịla ka e mee kemgbe ma tụkwa m n'anya.

"Ana m ekele ya maka ịkwanyere MKO Abiola, onye meriri na ntuliaka onyeisiala e mere na Juun 12 afọ 1993 site n'inye ya nzere GCFR. Nke a bụ nnukwu ihe!"

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

N'okwu ya, Gọvanọ Fayose kwuru na MKO Abiola kwesiri nkwanyere ugwu nke mere na ndị Ekiti kwanyeere ya ugwu site na ime ụbọchị Juun 12 ụbọchị ezumike na steeti ahụ.

Ayo Fayose

Ebe foto si, Ayofayose

Nkọwa foto, Fayose: Anyị mere Juun 12 ụbọchị ezumike iji kwanyere Abiola ugwu

Ọ gara n'ihu kwuo na nkwanye ugwu kachasị e nwere ike inye Abiola bụ ikwanyere iwu ala anyị ugwu na ime ka ntuliaka ghara inwe wuruwuru maọbụ magomago ọbụla.

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Nwa MKO Abiola bụ Hafsat Abiola-Costello sokwa na ndị tinyere ọnụ n'ihe a mere.

Hasfat Abiola-Costello

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, E gburu Kudirat bụ nne Hasfat Abiola-Costello ma bụrụkwa nwunye MKO Abiola maka okwu gbasara Juun 12

N'ozi o wepụtara, Abiola-Costello kwuru na ime Juun 12 ụbọchị ncheta ọchịchị onyekwuoucheya ọhụrụ, ma nyekwa MKO nzere GCFR, Kingibe GCON nakwa Gani GCON n'otu ụbọchị, na-egosi "obi m gbawara agbawa na ịkwụwa aka ọtọ, inye onye oke ruru ya, nakwa nkwanyere ugwu, ka dị ndụ n'ala ndị mụrụ m ji ndụ ha chụọrọ aja."

Ọ gara n'ihu sị: "Onweghị mkpụrụ okwu nwere ike ịkọwapụta udị afọ ojuju na ọṅụ m nwere. Ana m ekele Chineke na m dị ndụ hụ taa."

Akụkọ ga-amasị gị: