Onye zụrụ nwaanyị zụrụ obodo — Oriakụ Ezeokoli

Ebe foto si, AFP
Ndị ọnụ na-eru n'okwu n'ihe gbasara ụmụnwaanyị na nlekọta ha etola Ijeri dọla atọ ọgbakọ G7 wepụtara maka ọzụzụ nwa nwaanyị.
Ogechukwu Ezeokoli bụ onyeisi ọgbakọ na-ahụ maka ihe gbasara nwa nwaanyị akpọrọ 'Tensed' gwara BBC na ọ dịnma etu mba ndị nọ G7 si weputa ego ha etu ahụ ị ji kwado agụmakwụkwọ nwa nwaanyị.
Ọ sị na nke a dị nma maka na ọgbaaghara ọ bụla dara n'ezinaụlọ, na ọ kachasị emetụta ụmụnwaanyị karịa ụmụnwoke.
N'ọnụ ya "nwaanyị ọ bụla na-agụghị akwụkwọ agaghị enweike gbara onwe ya mbọ maọbụ chọọ ọrụ".
Gee ihe ọ gwara BBC Igbo n'uju ebe a:
Ọ bụghị sọsọ oriakụ Ezeokoli ka ihe a dị ụtọ n'obi.
Malala Yousafzai bụ nwata nwaanyị na-akwalite agụmakwụkwọ nwa nwaanyị gorsiri ọṅụ ya n'elu soshal midia maka nke a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O kenekwara ndị otu G7 maka ị kwe ụdị nkwa ahụ.
G7 bụ ọgbakọ obodo asaa a na-eme kwa afọ iji kpaa maka ọdịnihu obodo ndị a na ụwa niile, n'afọ a ha wepụtara $3b iji kwalite agụmakwụkwọ nwa nwaanyị.
Nke afọ 2018 na-eme na mba Canada ebe Donald Trump, onyeisiala Amerịka jụrụ ị binye aka n'akwụkwọ nkwado G7 aha bụ 'Communique' na bekee.










