"Aga m eweghachite 'fuel subsidy' ma wepụ nrụrụaka dị na ya"

Ebe foto si, Peter Obi
Peter Obi bụ onye ji ọkọlọtọ pati Nigeria Democratic Congress (NDC) azọ ọkwa onyeisiala Nigeria n'afọ 2027 ekwuola na ọ ga-eweghachịte ego enyemaka gọọmentị na-akwụ iji belata ọnụego mmanụ ụgbọala a kpọrọ 'fuel subsidy' na Bekee ma ọbụrụ na o merie na ntuliaka ahụ.
O kwuru nke a na mkparịtaụka pụrụiche ya na BBC nwere bụ ebe Obi kwuru na obi ya agbanwebeghi banyere atụmatụ ego enyemaka mmanụ ụgbọala kamgbe okwu banyere ya pụtara ihe.
"Agbanweghi m n'ebe m kwụụ. Ihe gbanwere bụ na mgbe ọbụla m kwuru okwu maka inwe ezi usoro a ga-agbaso, ndị mmadụ na-ekwu na-ekwu na echiche m agbanweela.
"Kamgbe m bidoro ikwu maka ego enyemaka mmanụ ụgbọala, m na-ekwusi ike na nrụrụaka bụ nnukwu nsogbu dị na ya."
Obi gara n'ihu kwuo sị na ọ ga-eweghachịte ego enyemaka ahụ gọọmentị na-akwụ maka mbelata ọnụego mmanụ ụgbọala.
"Ee, m ga-eweghachite ya, mana chetakwa na akọwara m na a ga-ewepụ nrụrụaka dị na ya."


























