INEC: Igwe 'card reader' ga-arụ ọrụ nkeọma na 2019

Ebe foto si, AFP
Onye nnọchianya INEC nke Imo steeti bụ Ọkammụta Francis Ezeọnụ bụ onye kwụrụ nke a mgbe ha gara ị kuziri ndị mmadụ maka omume ha na ntuliaka.
O kwuru na INEC na-agba mbọ ị gbanwe 'card reader' ahụ ka onweike rụọ ọrụ zuru oke na ntuliaka n'abịa.
O ji kwa ohere ahụ na-adọ ndị mmadụ na ndị ndọrọndọrọ ọchịchị aka na ntị na-asị ha n'oge iji akwụkwọ ntụliaka aghọ aghụghọ a gaala.
Ezeonu sị na a ga-ebido ndenye aha na ntụliaka otu mgbe iji mee ka ihe na-aga ọsọ ma hapụ igbu oge.
Ọ gwakwara ndị na-azọ ọkwa dị ịcheiche na ndị nkwado ha, sị ha gbaa mbọ gbasa ozi ha nkeọma maka na ohere ị me nrụrụaka agaghị adị ma ntuliaka bido.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:






