Patị ọhụrụ: INEC a nabatala akwụkwọ narị otu na

Ntuliaka

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, INEC na-ekwe nkwa na ha ga-eme ka ntuliaka nke 2019 ga n'ụzọ ziri ezi

Ụlọọrụ na-ahụ maka ntụliaka na Naijịrịa akpọrọ INEC ekwuola na ọ nabatala ihe ruru narị otu na asatọ ndị tinyere akwukwọ idebanye parti ọhụrụ.

Onyeisi INEC bụ Ọkammụta Mahmoud Yakubu kwuru nke a n'emume gbasara mgbasa ozi ọhụrụ akpọrọ 'Social Media Week'.

Cheta n'ụlọọrụ ahụ debanyere aha parti ndọrọndọrọ ọhụrụ ruru iri abụọ na otu na Dịsemba.

Nke a mere ndebanye aha party ọhụrụ ruo iri isii na asatọ.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọndị ọzọ ga-amasị gị:

Akara ntụ-ntụ

Yakubu kwuru na INEC na-elebanye anya na ya bụ akwụkwọ.

Ọ sị na ụlọ ọrụ ya ga-anedebanye aha parti ọfụọ tumaadị ndị soro ụsọrọ INEC weputara.

Onyeisi INEC kwuru na otu ndọrọndọrọ ọchịchị ọ bụla chọrọ idebanye aha n'akwụkwọ n'ọnwa isi tupu ochichi eruo agaghị sonye na ntuliaka.

O kwuru na obi dị ha ụtọ makana n'ime parti ọhụru iri abụọ na otu debanyere aha n'akwụkwọ, anọ n'ime ha bụ nwaanyi bụ ndi isi na ya.