Kano Pillars: Chinedu Udoji anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ

Ebe foto si, @pillarsfc
Otu jikọtara egwuregwu bọolụ na Naịjirịa bụ NFF etiela mkpu n'oke olu banyere ọnwụ nwafọ Naịjirịa na-agbara otu kano Pillars bọọlụ.
Udoji nwụrụ n'ụbọchi ụka n'ihe mberede nke okporoụzọ mgbe osi n'ụlọ ndịna ebe ọ gara leta ndị enyi ya na-agbara otu Enyimba bọọlụ ala.
Onye mgbasa ozi ndị Kano Pillars bụ Malikawa Garu kwuru na ụgbọala Udoji sọbara isi n'ihe nkewa etiti okporoụzọ jikọrọ ụzọ Club na Independent dị na Kano.
Udoji so gbaa asọmpi nke NPFL dị n'etiti ndị Kano Pillars na Enyimba n'ụbọchị ụka.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

Mgbe ndị ntaakụkọ BBC gbara otu onye ọka n'akụkọ egwuregwu bụ Ihunnanya Okoye mara Udoji nkeọma, ọ kọwara ya dịka onye mara ihe ọtagbutara n'egwuregwu bọọlụ.
O kwuru na Udoji nwere umeala na obioma, ebe o tikwara ezinaụlọ ya aka n'obi.
Gee ihe o kwuru:

Ihe ịkwesiri ị ma gbasara Chinedu Udoji

Ebe foto si, @EnyimbaFC
- Amụrụ Chinedu Udoji n'ụbọchị iri abụọ na abụọ ne ọnwa Desemba afọ 1989.
- Ụgbara afọ iri abụo na asatọ tupu oge ọnwa ya.
- Ọ na-agba bọọlụ n'ebe azụ maka igbochi inye goolu bụ defender n'olu bekee.
- Ọ gbara otu Enyimba bọọlụ tupu ọ gawa Kano Pillars
- Udoji mụrụ ụmụ abuọ tupu ọnwụ ya.

Ozi nkasị obi
Ọtụtụ ndị mmadụ na otu dịka NFF, Kano Pillars, Enugu Rangers, Rivers United na ndị ọzọ hụrụ egwuregwu bọọlụ n'anya ezigarala ezinaụlọ ya ozi nkasị obi:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2











