Port-Harcourt Mall explosion: Gaasị agbaala merụọ mmadụ ise ahụ na Port-Harcourt
Akụkọ ndị dị mkpa taa:
Gaasị agbaala merụọ mmadụ ise ahụ

Ebe foto si, LASEMA
Ọnụ na-ekwuru ndị Uweojii na Rịvas steeti bụ Nnamdi Omoni gwara BBC Igbo na ọdachi ahụ mere n'ebe Elekere atọ nke ehihie ụbọchị Wenezde.
O kwuru na mmadụ ise merụrụ ahụ na 'Port-Harcourt Mall' ebe e bugara ha ụlọogwụ maka nleta.'
Ọ gara n'ihu kwuo na ndị ọrụ ha na-enyocha iji mata ihe butere ihe ahụ gbara nụ.
Ụgbọelu ndịagha ụgbọelu dara n'ike na Katsina

Ebe foto si, @NigAirForce
Ụgbọelu Ndịagha ụgbọelu dara n'ike n'ọdọụgbọelu Katsina oge ha na-alọghachi site n'ebe ha gara ọgụ megide ndị omekeome na mpaghara ọdịda anyanwụ Ugwu Naijiria.
Ozi si n'aka ndị isi ndịagha ụgboelu kwuru na o nweghị onye tufuru ndụ ya n'ọdachi ahụ.
Ha gara n'ihu kwuo na ha ehiwela otu ga-elebanye anya n'ihee butere ihe mere.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Democracy Day: Emezuola m nkwa atọ m kwere- Buhari

Ebe foto si, Getty/ BBC
Dika e mere ncheta ochịchị onyekwuoucheya, ubochi Wednesday onyeisiala Naijiria bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ya mezuru nkwa nchekwa, nkwalite akụnaụba na agha megide nrụrụaka o kwere afọ anọ gara aga.
N'ozi ya ụbọchị Wenezde, onyeisiala Muhammadu Buhari, ọ rụtụrụ aka na ya kwere nkwa atọ; nchekwa, ịkwalite akụnaụba na ibu agha megide nrụrụaka ma kwụọ sị, " ọ nweghị onye ga-agbagha na m emezuola nkwa ndị a niile."
Ọ kọwara na ụbọchị June 12 bụ ụbọchị pụrụ iche n'ihi na ọchịchị nkịtị sị na aka ndị nkịtị banyekwa n'aka ndị nkịti.
Ọ gara n'ihu kwuo na "E nyere m Inec ohere ịrụ ọrụ ha na-enweghị mgbochi ọbụla."
O kerele ndị Naijiria maka ị tụnyere ya na ntuliaka 2019 ma kelee ndị ọrụ nchekwa maka iti ya onwe ha n'ihe egwu dịka ha na-echekwa ụmụ Naijiria.
Democracy Day Speech: Buhari gbara ọnyụpa na nkwa o kwere - Ohaneze

Mana otu Ohaneze Ndigbo agbaghaala okwu onyeisiala Buhari kwuru na ya mezuru nkwa ya dịka o si gbasa nchekwa, akụnaụba nakwa ọgụ megide nrụrụaka.
Odeakwụkwọ mgbasaozi Ohaneze bụ Chuks Ilegbu gwara BBC Igbo na ' Buhari gbara onyupa n'ihi na Boko Haram , ndị ntọ, ndị Fulani ọchịehi na ndị ohi ka na-akpa mkpamkpa na mpaghara dị icheiche na Naijiria.
Amaegwuregwu etiti bụzị amaegwuregwu Moshood Abiola

Ebe foto si, Getty Images
Buhari nọ n'emume ahụ gụgharịa amaegwuregwu etiti dị n'Abuja, Amaegwuregwu Moshood Abiola iji kwanyere MKO Abiola, ugwu.
Anyị ga-agba mkpebi ụlọikpe banyere Okorocha- Inec

Inec ekwuola na ha ga-agbagharị akwụkwọ n'ụlọikpe mkpegharị n'ihi iwu ahụ ụlọikpe nyere ka ha nye Rochas Okorocha asambodo mmeri, sị na emeghị otua ga-anwụnye aja na gari n' usoro ntuliaka na ọchịchị onyekwuo uche ya.
Jamb Cut off: Pọint e ji aba mahadum

Ebe foto si, Jamb/webste
Jamb ekpebiela na onye chọrọ ịba mahadum n'afọ a ga-enwe opekata mpe akara otu nari na iri isii.
Gee akụkọ ndị a n'otu nkeji ebe a:
Maka nwaanyị egburu ụmụ ya n'Ebonyi

Ebe foto si, Getty Images
A nwụchiela mmadụ anọ eche gburu ụmụaka abụọ n'Ebonyi.
Aka ndị uweojii akpara mmadụ anọ a na-eche na aka ha dị n'ogbugbu ụmụaka abụọ otu nne ji n'Umuogodoakpu-Ngbo dị n'Okpuruọchịchị Ohaukwu n'Ebonyi steeti.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Loveth Odah kwuru na otu onye ọzọ ndị ọjọọ ahụ meruru ahụ nọ n'ụlọọgwụ anata ọkwụkwọ, ebe ndị otu ha na-enyọnye anya n'ihe mere dị a jiri kpaa ụdị agwa a.
Okwuru na nna ụmụaka ahụ egburu egbu bụ onye bị n'Onicha lọtara bịa kwuo na ndị ya na-eche mere arụ ahụ bụ ndị ya na ha na-azọ ala.
Ọ sị na ndị ahụ kwere ya nkwa na mgbe ya ga-alọta na "ihe dị iche ga-adị n'ezinaụlọ ya".
Mmadụ anọ a nọ na aka ndị uwe ojii azara ọnụ ha ugbua.
Rochas enwetala asambodo mmeri

Ebe foto si, Rochas Okorocha Facebook
Ụmụibe ka anyị bidonu na Imo steeti ebe Inec nọ n'Abụja ụnyahụ nye Rochas Okorocha asambodo mmeri dịka onye nọchite anya Imo West Senitorial districk.
Nke a na-eme ka ụlọikpe ukwu nọ n'Owerri nke Jọstis Ngozi Okoha nọ n'isi ya sị Inec ha anwakwala anwa nye ya ya bụ asambodo.
Taa bụ ụbọchị ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya

Ka anyị chetara ụnụ na taa bụ ụbọchị ezumike nye ndị ọrụ na Naijirịa gbaa gburugburu.
Taa ka gomenti etiti nyere maka ncheta ọchịchị onye kwuo uche ya bụrụkwa ụbọchị akagburu ntuliaka nke MKO Abiola meriri afọ iri abụọ na isii gara aga.
Ngagharị iwe na Honk Kong

Ebe foto si, Reuters
N'ofesi, dịka ngagharị iwe ka na-ebiri ọkụ na Hong Kong maka iwu gọmentị chọrọ itinye maka ikpe ndị dara iwu obodo ikpe na Chine ndị mmadụ akwụchiela ezi na ụzọ niile na mba ahụ.
Ka ọ dị ugbua ndị ụlọomeiwu akwụsịla itinye ọnụ na ya bụ iwu rụọ mgbe okwu dajụrụ.
US vs Thailand

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu iko mba ụwa ụmụnwaanyị, US afọọla Thailand aja n'ọnụ site nye ya ọkpụ goolu iri na atọ n'asọmpị ha ụnyahụ.
Ekere ha goolu otu otu ọfọdị atọ maka ndị nọ na benchi. Naịjirịa na South Korea ga-akwata ya na elekere abụọ nke ehihie.











