"Nwa m nwoke dị afọ 13 gburu nwa m nwaanyị"

Oge Charity Lee dị naanị afọ isii, nne ya gbagburu nna ya ebe ha bi na Texas mana amaghị ya ikpe ọnwụ.
Ka afọ ole na ole gachara, Charity mụtara nwa gburu nwanne ya.
Nwa ya nwoke bụ Paris dị naanị afọ 13 oge o magburu nwanne ya nwaanyị bụ Ella dị afọ anọ.
Nke a pụtara na Paris nọ n'ụlọ mkpọrọ kemgbe afọ 11 gara aga nwere ike ịtọ ebe ahụ ruo oge ọ ga-agbagote afọ 50 na ọma.
Kedụ etu nne ga-esi ghọta na nwa ya bụ onye agwụ na-akpa?
Nne onye gburu nwanne ya ọ kwesịrị ịka hụ ya n'anya?
Charity tụrụla ime Paris oge ọ dị afọ 20, ka ọ nọ na mahadum. Ka afọ itoolu gafere, ọ mụrụ Ella.

N'olu Charity; "ebe Paris bụ omenanwayọ, Ella bụ ọbataosu ọkachasị n'egwuregwu."
"Paris dị ka ọ hụrụ Ella n'anya nke ukwu, ebe Ella n'onwe ya ejighi ya egwu egwu."
"Paris na-anọkarị nwayọ, mana dịka ụmụaka ndị ọzọ, ọ na-enwe oge ọ na-enye nsogbu mana enweghi ihe ọbụla o mere kpatara ka elebara ya anya iche."

Paris bidoro ilekọta nwanne ya nwaanyị oge ọ dị afọ 12, ka Charity laghachịrị n'ịṅụ ọgwụ ike; n'ime ọnwa isii.
Charity mechara chịkọlata onwe ya ọnụ, laghachị n'ụlọakwụkwọ ma bido ịrụ ọrụ.
Ụbọchị anọ nke Febụwarị 2007

Charity kwuru "agaghị m atụ asị, izuụka ahụ tara akpụ," a kọrọ ọnụ.
Tupu ọ gawa ọrụ ụbọchị ahụ, ime ụlọ ha dịka ihu agha, mana ọ bụghị mbụ nwokorobịa ga na-ewesara nne ya iwe.
"Ella abụghị onye na-ebe akwa ma m na-apụ apụ, mana ụbọchị ahụ o kwugidere 'nne makụọ m ọzọ, susuo m ọnụ ọzọ'. O kwuru ya ọtụtụ oge, mere na m agaghị ọrụ n'oge."
Charity makụkwara Paris tupu ọ gawa ọrụ, gwa ya "ị ma na m hụrụ gị n'anya. Anyị agabigala nke ka nke a njọ, anyị ga-apụtakwa na nke a."

Ka e mechara, ndị uweojii bịakutere Charity n'ụlọọrụ ya gwa ya na nwa ya anwụọla, na Paris gburu nwanne ya nwaanyị.
Etu ihe si mee
Paris gakwuru onye na-anodo ha gwa ya ka ọ lawa tupu nne ya alọta.
Ka ọ lawara, Paris bara n'ọnụụlọ Ella, tie ya ihe, tọdo ya n'akpịrị ma sụọ ya mma ugboro 17.
Ọ kpọrọ otu enyi ya n'ekwentị, kpaa nkata nkeji isii tupu ọ kpọọ ndị gbatagbata n'akara 911.
Ha gwara ya etu ọ ga-esi kunye nwanne ya nwaanyị ume ndụ, ọ gwa ha na ọ na-anwa ike ya, mana e mechara chọpụta na ọ nwaghị ike ya ịzọ Ella ndụ.

Paris jụrụ Charity "gịnị ka ị ga-eme ugbua" ka ọ bịara ịhụ ya ebe ndị uweojii nwụchiri ya.
Ka Charity jụrụ ya ihe kpatara ajụjụ a, o kwuru sị "ị na-ekwukarị na onye ọbụla merụọ ụmụ gị ahụ, na ọ bụ naanị oge ahụ ka ị ga-egbu mmadụ - gịnị ka ị ga-eme ugbua?"
Charity sị na o jighi ụjọ jụọ ya, na ọ jụrụ ya ajụjụ a dịka ọ na-ama ya aka.
"Nke a bụ mbụ m na-ahụ ihe ọzọ n'ime Paris. A ma m na ọ nwere iwe, mana nke ahụ abụghị naanị iwe. Ọ bụ ọchịchịrị."

Gịnị mere Paris ji gbuo Ella?
Paris gwara ndị uweojii na ya na nwanne ya nọ n'ụra, o teta hụ na Ella abụrụla mmụọ ọjọọ nwuru ọkụ, ya mere o ji were mma chọọ ịmagbu mmụọ ọjọọ a.
Nyocha e mere gosiri na ọ nọ na-enyocha etu ọ ga-esi gbuo nwanne ya nakwa nne ya n'elu ịntanetị.
A tụrụ ya nga afọ 40 maka igbu Ella n'afọ 2007.
Charity ka na-aga eleta ya n'ụlọ mkpọrọ makana n'olu ya, "ọ kwụsịbeghị ịhụ nwa ya nwoke n'anya."

Charity mechara mụta nwa ọzọ na 2013; afọ isii Ella nwụchara.
Paris dị afọ 25 ugbua ka nọ n'ụlọ mkpọrọ na Texas, ebe e nwere ike ịtọhapụ ya n'afọ 2047.
Akụkọ ndị ọzọ ga-amasị gị










