9th Assembly Inauguration: Ndị nwereike ịpụta dịka ndị isi Ụlọomeiwu

Ebe foto si, Other
Ihe niile gaa etu esi tụọ anya, a ga-ehiwe Ụlọomeiwu nke itoolu ma họpụta onyeisi Sịnetị nakwa nke ụlọomeiwu nta n'ụbọchị iri na abụọ nke ọnwa Juun.
N'Ụlọomeiwu ukwu, a ga-ahọpụta onyeisi na osote ya bụ nke Bekee na-akpọ "Senate President" na "Deputy Senate President".
N'Ụlọomeiwu nta a ga-ahọpụta onyeisi na osote ya nke Bekee kpọrọ "Speaker" na "Deputy Speaker".
Ndị a ga-ahọpụta ga-anọ afọ anọ - ma ya bụrụ na-achụtughi ha - bụ oge ha ga na-ahazi ụlọomeiwu abụọ ahụ.

Ebe foto si, @NGRSenate
Ụlọomeiwu nke asatọ, bụ nke Bukola Saraki na Yakubu Dogara nọ n'isi ya bụ nke mbụ patị na-anọghị n'ọchịchị (PDP) wepụtara osote onyeisi - Ike Ekweremadu rụrụ ọrụ dịka onye Bekee kpọrọ "Deputy Senate President".
Ọnọdụ ahụ pụtara dịka ọtụtụ mmadụ na-echeghi - site n'adịghị n'otu n'etiti pati na-achị bụ APC mgbe e mere nhọpụta nke afọ 2015.

Ebe foto si, Facebook/Nigerian HoR
Mgbe ahụ, n'ụtụtụ a ga-eme nhọpụta ndị isi, ụfọdụ ndị omeiwu APC - ma ndị so azọ ọchịchị - gara nzukọ a sị onyeisiala kpọrọ ha, tupu ha apụta, Saraki na ụfọdụ ndị APC ndị ọzọ na ndị omeiwu PDP emeela ntuliaka iji họpụta ya na Ikweremadu dịka ndị isi Ụlọomeiwu asatọ.
Ọ bụ Lawan ka APC họpụtaburu ịchị Sịnetị n'afọ 2015.
Ugbua, ndị APC adịghị ka ndị chọrọ ka ụdịrị ihe ahụ mee ha ọzọ. Ha na-agbalị ịhụ na ha kwekọrịtara n'onwe ha tupu a pụta n'ụbọchị ntuliaka.
Ndị na-azọ oche Sinetị

Ebe foto si, @SenAhmadLawanI
Na Sịnetị, ndọrọndọrọ onye ga-abụ onyeisi dị n'etiti Ahmed Lawan, bụ onye bụbụ onyeisi patị na-achị n'Ụlọomeiwu ka rụchara ọrụ, na onye ọ naara ọchịchị n'aka bụ Ali Ndume.
N'izuụka gara aga Danjuma Goje so na-azọ ọchịchị a wụsara ọwa dịka Onyeisisala Muhammadu Buhari tinyere ọnụ na ya bụ okwu.
Ihe Buhari mere na-egosi na ọ chọghị ka ihe mere n'afọ 2015 mee n'ọgbọ a.
Agbanyeghị na Onyeisiala Buhari, APC na ụfọdụ ndị PDP na-akwado Ahmed Lawan, Ali Ndume sị na ọ gwụla ma e meriri ya bụ na ọ kwụsị ịzo ọkwa a.
Mkpebi ya na-ada ka nke Bukola Saraki mere n'afọ 2015, nke mechara ga ka o si chọọ ya.
Kedu ndị chọrọ ịbụ osote?

Ebe foto si, Orji Uzo Kalu/Facebook
Dịka mmadụ abụọ a na-achịpụ ya, oche onye ga-abụ osote onyeisi na Sịnetị nọkwa na ndọrọndọrọ.
Ndị a na-anụ aha ha na nke a bụ aka chịbụrụ Abia Steeti bu Orji Uzo Kalu - bụ onye tozuru ọchịchị n'Ụlọomeiwu dịka oso n'Ụlọomeiwu nke ọchịchị ndị nkịtị akpọrọ 3rd Republic na-Bekee - na Ovie Ome-Agege nakwa Kabiru Gaya.

Ebe foto si, `
Akuko na-ekwu na ndị APC na-akwado Omo-Agege na ndọrọndọrọ ọchịchị a.
Ndị na-azọ oche Ụlọomeiwu nke obele

Ebe foto si, Facebook/Femi Gbajabiamila
N'Ụlọmeiwu nta, ọ bụ Femi Gbajabiamila ka APC kwadoro ka ọ bụrụ onyeisi ndị Ụlọomeiwu nta n'afọ 2015, tupu Yakubu Dogara e rite ya site na nhazi ya na ndị PDP.
Ugbua, ọ bụ kwa ya ka ndị APC kwụ n'azụ n'agbanyeghi na Mohammed Bago si Naịja Steeti na John Dyegh si Benue Steeti so na ndị na-ama ya aka n'ihụ.
Akukọ na-ekwu na Nkeiruka Onyejocha si Abịa Steeti adịghị azọzi ọkwa ahụ mana ọ dị ka Segun Odebunmi; Emeka Nwajiuba na Olajide Olatubosun ka nọ na ya bụ ndọrọndọrọ.
Onye APC họpụtara dịka onye a ga-akwado make osote onyeisi n'Ụlọomeiwu nta bụ Idris Wase bụ onye na-anọchịteanya mpaghara Wase dị na Platu steeti.
Usoro nhọpụta ndị isi Ụlọomeiwu Ukwu

Ebe foto si, @NGRSenate
Ndịomeiwu niile tozuru ịzọ oche ndị a, mana usoro ha kpọrọ "Standing Order" na Bekee sị na ọ bụ site na ndị tọkachara ka a ga-enye ọchịchị.
N'usoro a sị: "Nhọpụta ndị Sịnetọ ga-abụ ndị isi n'usoro ọbụla ga-esite na ọtụtọ n'ụdịrị a:
(I) Ndịomeiwu na-alaghachite site n'ugboro ole ha meriri ndọrọndọrọ;
(ii) Ndịomeiwu ukwu nọ bu nke obere;
(iii) Ndịomeiwu batara ọhụrụ.
Nke a pụtara na ndị nọbụ n'Ụlọomeiwu na-enwete ohere kara ndị ọzọ bịara ọhụrụ.











