Nigerian Senate: Ụlọomeiwu abụzị ebe 'ezumiike nka' ndị gọvanọ?

Orji, Egwu, Nnamani, Okorocha, Kalu

Ebe foto si, Facebook

Na ntuliaka e mere ụbọchị 23 nke ọnwa Febrụwarị 2019 a, gọvanọ ise chịburu steeti ndị dị na mpaghara ọwụwa-anyanwụ zọtara oche n'ụlọomeiwu ukwu.

Ihe ọzọ jịkọrọ mmadụ ise a bụ na ha chịchara steeti ha afọ asatọ (ugboro abụọ) tupu ha azọta oche a.

Nke a mere ka ụfọdụ mmadụ na-ajụ ma ụlọomeiwu Naịjirịa abụzị ebe 'ezumiike nka' ndị Gọvanọ?

BBC Igbo chọrọ ịkọwara gị etu ndị gọvanọ a na ije butere ha n'ụlọomeiwu si gaa.

Ndị nke ka "na-abịa abịa"

1) Rochas Okorocha

Okorocha dị ọnọdụ ka "JJC' n'ụlọomeiwu, makana ebe ụfọdụ ndị otu ya garala ugboro ugboro, nke a ga-abụ mbụ ọ ga-anọ n'oche ahụ dịka onye omeiwu Naịjirịa.

Na ọ ga-abụ "JJC" n'ụlọomeiwu dịka ọ zọtara oche ndị "Orlu zone" na ntuliaka 2019 a, apụtaghị na Okorocha bụ anụ taa n'ihe gbasara ọchịchị.

Rochas Okorocha

O bu ụzọ zọọ ọkwa onyeisiala n'afọ 2003, n'okpuru "All Nigeria Peoples Party (ANPP)", o mechara hibe pati Action Alliance (AA) n'afọ 2005.

Okorocha anọkwaala na pati PDP, mana n'APGA ka ọ nọ oge ọ zọtara oche aka na-achị Imo steeti n'afọ 2011; Ọ banyere APC ebe ọ nọ chịa Imo nke ugboro abụọ.

Okorocha kwuburu n'afọ 2018 na ọ gaara azọ ọkwa onyeisiala, mana ọ gbajọrọ ime ya makana Onyeisiala Muhammadu Buhari bịara kwuputa uche ya na ọ chọrọ ịzọgharị.

Orji Uzor Kalu

Kalụ bụkwa "JJC' bụ onye ọzọ anaghị ata ntị ya ata na-aga Ụlọomeiwu Ukwu n'afọ 2019 a.

Orji Uzor Kalu

Ebe foto si, Facebook/Orji Uzor Kalu

Ọ zọtara oche Abịa Nọt n'okpuru pati APC, mere na ọ ga-abụ mbụ ọ na-aga n'ụlọomeiwu ukwu.

Kalu chịrị Abịa steeti site n'afọ 1999 ruo 2007 n'okpuru pati PDP, ọ zọkwara ọkwa onyeisiala n'afọ 2007, n'okpuru "Progressive Peoples Alliance (PPA)" bụ pati o hibere.

Ndị nke na-alọghachị

Sam Egwu

Egwu chịrị dịka gọvanọ Ebọnyị steeti n'okpuru PDP site n'afọ 1999 ruo 2007, ma zọte oche n'ụlọomeiwu ukwu dịka onye na-anọchi anya ndị Ebọnyị Nọt n'afọ 2015.

Sam Egwu

Ebe foto si, Facebook/Sam Egwu

Ọ zọtakwara oche ya ọzọ na ntuliaka nke afọ a, nke bụ na ọ ga-anọkwa ebe ahụ afọ anọ ọzọ.

Egwu rụrụ dịka minista na-ahụ maka agụmakwụkwọ site n'afọ 2008 ruo 2010.

Theodore Orji

Orji a ma dịka T.A Orji, na-alọghachị n'ụlọomeiwu ukwu ebe ọ na-anọchite anya ndị Abịa Sentralụ kemgbe afọ 2015.

TA Orji

Ebe foto si, Facebook/TA Orji

Ọ chịrị Abịa steeti site n'afọ 2007 ruo 2015.

Orji bụ gọvanọ mbụ si ụlọmkpọrọ banye ọkwa ọchịchị na Naịjirịa.

Ọ nọ n'okpuru pati PDP.

Chimaroke Nnamani

Nnamani akatala ahụ n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị.

chimaraoke nnamani

Ebe foto si, Facebook/chimaraoke nnamani

Oche ọ zọtara na ntuliaka 2019 a emeela ya ugboro abụọ ọ na-aga Ụlọomeiwu Ukwu.

O bu ụzọ zọta oche ndị Enugu-East n'Ụlọomeiwu n'afọ 2007 ruo 2011, ka ọ chịchara Enugu steeti dịka gọvanọ site n'afọ 1999 ruo 2007.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: