Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka

Aha onyonyo, Peter Obi na Atiku dara election n'ihi na Obi kparịrị Chukwu n'elu Ọlta - Fr Mbaka

Onye ụkọchukwu ama ama bụ Rev. Fr. Ejike Mbaka ekwuola na ya ga-eji izu ụka a niile na-eto chukwu ma na-enwe aṅụrị maka mmeri Buhari meriri Atiku.

Mbaka kwuru na ọ bụ maka mkparị Peter Obi na ndị otu ya kparịrị ya ka o jiri daa ya bụ ntuliaka.

O kwuru nke a n'ụbọchị Febrụwarị 27, 2019, mgbe ọ na-eme ekpere kwa Wenezde ya bụ "I no dey again" n'obi Adoration n'Ụmụchigbo iji Nike Enugwu.

Mbaka dọrọ ndị mmadụ aka na ntị ka ha ghara ịdị na-akọtọ ya n'ihi na amụma ọbụla o buru bụ nke mụọnsọ gwara ya kwuo.

O siri na ya gabigara ọtụtụ nkwutọ na ihe ịkpawa obi kamgbe ya na Peter Obi nwere nsogbu na Bazaar n'afọ gara aga.

Okwuru na ya gwara Peter Obi na Atiku na ha bụ ndị dara ada tupu o foo ha na anya.

Ọgara n'ihu maa ọkwa na ndị mmadụ na chukwu amazịla aka n'ihi na ọ bụ Chukwu kpọrọ ya oku.

Akụkọ ga-amasị gị: