Ndị 'Genz' Madagascar ekwechirila n'ime ngaghariwe na-agbanyeghí mkposa imeobi Onyeisiala ha

Ebe foto si, Reuters
Na-agbanyeghị na Onyeisiala mba Madagascar bụ Andry Rajoelina chụrụ kposara ndị imeobi ya ma chụọ ha n'ọrụ, ndị ntorobịa mba ahụ gara n'ihu na ngagharịiwe ha na-eme maka ọnọdụ akụnaụba mba ahụ n' ụbọchị Tuzde.
Ndị uweojii Madagascar gbara ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe anwụrụ anyammiri dịka ha lọghatachiri n' okporoụzọ.
A malitere ngagharịiwe n;isobodo Antananarivo mana ngahariiwe ahụ gbasara na obodo asatọ ndị ọzọ mepere emepe na mb ahụ n'ihi megide nsogbu mmiri na ọkụ.
N'ụbọchị Monde, Onyeisiala Rajoelina kposara imeobi ya iji mee ka obi dajụọ ndị ntorobịa na-eme ngagharịiwe.
Mana ndị na-ahazi ngaghariiwe ahụ juru ịnabata ozi onyeisiala, dịka ha kporo ya oku ka ọ rịọ mgabghara maka ndị ọrụ nchekwa gburu na ngharịiwe ahụ.
Otu onyeisi otu 'United Nations' kwuru na e gburu mmadụ ruru22 ebe ndị merụrụ ahụ ruru 100.



















