Ụlọomeiwu abụọ akpọọla Buhari oku

Onyeisioche ndị Sineti Bukola Saraki

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Ndị ụlọrụ sineti ebidola nyocha ihe Buhari mere

Ihe ga adị n'isi okwu ga-abụ oke ogbugbu mmadụ na-eme na mpaghara Naịjiria karịcha na Benue steeti egbe ndị ọchịehị gburu mmadụ kariri 70 n'ọnwa Jenụwarị.

Ndị nọ n'isioche n'ụlọ sineti kwuru na ha gha enwe mkparịta ụka tupu ha ekwuo mgbe Buhari ga-abịa zara ọnụ ya maka ogbugbu ndị a.

Ọ bụ kwa uche ụfọdụ ndị Sinetọ ka ebido ọnọdụ ọ dị n'ụkọ na Benue steeti jiri ya chekwa ndị mmadụ tupu ahazi cha ihe.

Cheta na gọọmentị etiti na ndị agha Naịjiria bidoro atụmatụ a kpọrọ ọsọ nwa mba mana ọ beghị oke ogbugbu ndị a.

Onyeisiala Buhari na ndị isi oche ụlọomeiwu abụọ

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, Onyeisiala Buhari na ndị isi oche ụlọomeiwu abụọ

Nke a na-abịa ebe ụlọomeịwụ nke nta na-ekwu na Onyeisiala Muhammadu Buhari adaala iwu nke dị ukwu.

Ha kwuru nke a ebe akụkọ pụtara na Buhari wepụrụ ihe kariri nde dọlla narị anọ n'akpa gọọmentị etịtị n'anataghị ụlọọmeiwu dị ịcheịche ikike ị me nke a.

Ụlọọrụ sinetị ekwuola na ha ga-ebido ị nyocha okwu a ka ha mara ma Buahri adara iwu ga-eme ka ewepu ya n'ọkwa ọchịchị.

Akụkọ ndị ga-amasị gị: