Walter Onnoghen: O nweghi ihe ghọrọ ya ahịa - Ọkaiwu

Ebe foto si, Getty Images
Ọ bụ ụnyaahụ ka onye na-ekwuchitere onyeisiala ọnụ bụ Garba Shehu dere n'akara twitter na Onnoghen alaala ezumike nka.
Buhari kwuru na ọ nabatara akwụkwọ ezumike nka ya ma kelee ya na mgbalị niile ọ gbalịrị na Naịjirịa.
Mana o nweghi ahịa ihe ndị a ghọrọ Onnoghen n'ihi na ọ ga-erite oke niile ruru ya aka dịka ọkaikpe kachasị lara ezumike nka.
Onye kwuru nke a bụ onye ọkaiwu bụ Barrister Chijioke gwara BBC Igbo n'ekwentị.
"Ebe akwụkwọ ezumike nka ya ruru onyeisiala aka tupu o mee ihe otu CCT gwara ya mee, o nweghizi ihe ga-eme ya (Onnoghen)"
Chijioke kwuru na n'agbayeghị na NJC nyekwara ndụmọdụ ka e wepu Onnoghen, ọ gaghịzi enwe isi ugbua.
Cheta na a kwụsịrị Onnoghen ọrụ n'ike ka enwereike inyocha ebubo eboro ya maka ịzopu akụnaụba ya.
Onnoghen n'onwe ya mechara tinye akwụkwọ arụkwaghịm mgbe a ka na-enyocha okwu ya.
Onye bụ Onnoghen?

Ebe foto si, National Judicial Council
- Walter Samuel Nkanu Onnoghen bụ onye Cross River state bụbu onye ọkaịkpe kachasị na Naịjirịa.
- Ọ gara Mahadum Ghana ebe ọ gụrụ maka Iwu ala.
- O bidoro ọrụ gbasara Iwu ala dịka ọkaiwu na Ministrị na-ahụ maka ikpe nkwụmọtọ na Legọs n'afọ 1978.
- E mere ya ọkaikpe kachasị na Naịjirịa n'ọnwa Maachị n'afọ 2017.
- E boro ya ebubo ịzo akụnaụba ya n'ọnwa Jenụwarị afọ 2019.
Akụkọ ga-amasị gị ịkọ taa niile.









