Imo Awka: Mmemme a bụ Opu-Eke

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Ndị agbara Ezenwaanyị na-efe Imo Awka, na agbara ya egwu mmụọ bụ Opu-Eke iji kelee ya maka onyinye onyere ha
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Ka mgbe otu Udi uka mmemme dị iche iche juputara n'Awka iji kelee o Awka maka nchekwa ochekwabara ha ya na ịza ha ekpere mgbe niile.

Mmemme "Opu Eke, Imo Awka" bụ ụbọchị ụmụnwaanyị na-efe Imo Awka ji enye ya onyinye maka nchekwa ya n'afọ gara aga.

Ha na ekwe ya nkwa, yọkwaa ya arịrịọ ngozi maka afọ ọhụrụ nke ha na-abanye.

Lee etu o si gaa ka BBC Igbo tụrụ ụkwụ ebe ahụ n'ụbọchị nke mbụ:

E mere emume a ụbọchị abụọ tupu ọ bịa n'isi njedebe.

N'ụbọchị nke abụọ, ndị nmmadụ pụtara n'igwe iji bịa nwere obi aṅụrị dịka emume a na-aga.

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Ezenwaanyị na-efe Arụsị Imo Awka.

Na ya bụ obi arụsị ahụ nke a na-akpọ "Ọrụrụ Imo Awka" ndị Ezenwaanyị dị icheiche kpụtara ya bụ arụsị ehi, ebune, ji nakwa onyinye ndị ọzọ.

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Ndị pụtara ịkiri mmemme Imo Awka

Nke a bụ iji gosi obi ụtọ ha na ebe arụsị Imo Awka nọ nke ha na-akpọ nne ha.

Mmemme Imo Awka
Nkọwa foto, Nwaekemezie Onwudinjo, Aka na-akụ Opu-Eke na mmemme Imo Awka.

Naanị out nwoke na-akụ ya bụ opu Eke, ọbụkwazị naanị onye Eze nwaanyị tozuru etozu, nọrọ na mmụọ ka ya na arụsị Imo Awka ga-agbakọ Opu Eke ya.

Akụkọ ga-amasị gị