Ikeji Festival: Ihe BBC Igbo hụrụ n'Arondizuogu

Ikeji bu emume eji mara ndị Aro niile nke gunyere Arọchukwu na Arọndịzuọgụ.

Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ. April 2019.
Nkọwa foto, Ikeji bụ emume e ji mara ndị Arọ niile nke gunyere Arọchukwu na Arọndịzuọgụ.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ
Nkọwa foto, Mmọnwụ dị icheiche pụtara ebe ahụ
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Otu agụbata bu akpatị ọgwụ e ji eme emume.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Onye ntoroọbịa na-enweta onwe ya.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ
Nkọwa foto, Ndị Arọchukwu na-eme nke ha na ngwụcha oge ọrụ ubi ebe Arọndịzuọgụ na-eme Ikeji tupu ha amalite ọrụ ubi nke afọ ahụrụ.
Ụmụnwaanyị bịara mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ ka ha yi uwe mara mma
Nkọwa foto, Ọ bụ emume a ka e ji ekele Chineke maka ọkụkụ na owuwe ihe ubi kwa afọ ọbụla ma rịọkwa ya ogologo ndụ iji hụ afọ na-abia. Ụmụ nwaanyị na-elele anya ka ụmụnwoke na-eti mmọnwụ
Mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ
Nkọwa foto, Emume a malitere mgbe gboo n'Arọndịzuọgụ mgbe Nnanna hiwere Ịzuọgụ si Arọchukwu bịa Arọndịzuọgụ.
Ndị onye jiri unyi ka ọ pụtara n'Ikeji Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, A na-eme emume a n'abalị asaa nke gụnyere ịtụ aja dị icheiche, ebe ezinaụlọ ọbụla ga-egbu ewu na ọkụkọ were tụọrọ ndị nnanna ha aja
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Ọzọ bụ ịpụ n'ama ebe ndị Ịzụọgụ niile ga-aga tie mmọnwụ dị icheiche.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Ndị mmadụ na-ete onwe ha agwa dị icheiche n'ụzọ ama.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Oriri na nkwari dị ya n'uju ka ndị na-ere ahịa nọ na-ere ahịa ha.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, N'oge Ikeji Arọndịzuọgụ, ọtụtụ ụmụafọ ha ndị bi na Naịjirịa nakwa mba ofesi na-alọta iji kwanyere ndị nnanna ha ochie ugwu ruru ha.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Anyị hụrụ mmọnwụ karịrị asatọ ebe ahụ
Emume Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, Onye a na-ese, ọ na-ese onye ọzọ
Ndị mmemme Ikeji n'Arondizuogu. April 2019.
Nkọwa foto, Ndị ntoroọbịa ebe ha na-egosi ihe nkarị dị icheiche iji sachapụ afọ garaga n'oge mmemme a.
Ndị mmemme Ikeji n'Arọndịzuọgụ.
Nkọwa foto, A na-eme nkwado abụọ tupu ebido mmemme Ikeji, nke ndị ụka na nke ndị omenala, mana onye mmemme a na-eṅomi ndị ụlọụka na nke ya