Imo steeti: Ihedioha ehiwela kọmitii ga-etinye anya n'akụ na ụba steeti ahụ
Akụkọ dịmkpa m'ụtụtụ a

Ebe foto si, Dịka okwe sị nwe gba maka ndị ahọpụtara ị ga ụlọme
N'Imo, dịka aka na-achị steeti ahụ bụ Emeka Ihedioha kpọpụtara Ndukwe Nnawuchi dịka Okaiwu ukwu steeti ahụ, gọvanọ ahụ ehiwela kọmitii ga-enyocha akụ na ụba dịka enyefere ha ọchịchị n'aka.
Kọmitii a ga-enyocha ebe niile ego gọmentị dị ruo mgbe e nyefere ha ọchịchị izuụka gara aga.
Ndị uweojii emechiela ọgbakọ ndị mmadụ na Kano

Ebe foto si, AFP
Na Kano steeti ndị uweojii ewuchiela ọgbakọ maọbụ ngagharịiwe n'udị ọbụla ruo mgbe "fada nyere notisi".
A na-eche na iwu a metụtara obiiwe ndị mmadụ gbasara ebubo eboro Emir nke Kano bụ Muhammadu Sanusi gbasara ego dị ijere Naịra atọ na ụma gọmmenti sị na o mefuru n'ọkpọrọ.
Nwoke anya ya dị na ịnọchi Theresa May

Ebe foto si, EPA/ANDY RAIN
Ụnụ ahụlanue, otu onye anya ya dị na ịnọchị ọkwa Theresa May bụ Michael Gove arịọla mgbaghara maka isechara nwa anwụrụike mgbe ọ dị n'okobia.
Gove na arịọ ibe ya ka ha leghere ya bụ ajọ agwa anya dịka ihe ya mere mgbe ya amachaghị ihe.
N'egwuruegwu asọmpi iko mbaụwa ụmụnwaanyị

Ebe foto si, AFP
N'egwuruegwu dịka iko mbaụwa ụmụnwaanyi na-aga n'ihu ugbua, mba Germany ewerela otu ọkpụ sị ndị China ha ga tukwuru ala na nke a abụghị karate.
Cheta na Naịjirịa na Norway ga-akwata ya na elekere asatọ nke abalịa. Ebee ka ị ga-anọ? Chọta anyị na BBC Igbo ka anyị gwa gị ka o si akpọtụ.
Gee nkeji
AIT na Raypower alaghachiela ikuku

Ebe foto si, @AIT_Online
Ụlọ ọrụ mgbasaozi African Independent Televison na ogbo ha bụ Ray power radio alaghachiela ikuku dịka ụlọikpe siri kwuo ụnyaahụ mgbe ọkagbụrụ mbachi NBC machiri ha.
Ka ọ dị ugbua, AIT na Raypower na-agbasa ozi dịka ha si eme na mbụ.
Gụọ akụkọ ndị n'uju ebe a: , NBC anapụla AIT, Ray Power ikike mgbasaozi
Okorocha na-enwe aṅụrị

Ebe foto si, Rochas Okorocha/twitter
Onye ọzọ na-arachakwa oroma si ụlọikpe ugbua bụ aka chụbụrụ Imo steeti bụ Rochas Okorocha.
N'ozi ọnụ na-ekwuru ya bụ Sam Onwuemedo sị na Okorocha nabatara mkpebi ụlọikpe ma sị na ọ ga-agbaghara ndị ọ si na aka ha dị ihe mere ya.
Gụọ maka nke a ebe:
N'Ofesi

Ebe foto si, Getty Images
Aka na-achị mba Amerịka bụ Donald Trump ewezugara atụmatụ itinye ihe n'ụtụ isi ha na-anata na mgbere si mba Mexico abata be ha.
Nke a bịara ka Mexico kwenyere na ha ga-agba mbọ hụ na ha belatara ndị sị mba ha aga Amerịka.
N'Ewguregwu

Ebe foto si, NFF/twitter
Naịjirịa ga-agba asọmpị bọọlụ abụọ taata.
Super Falcons ga-ezute Norway na elekere asatọ nke ehihie
Dịka Super Eagles ga-ezute Zimbabwe na asọmpị enye na enye n'ama egwuregwu Stephen Keshi dị n'Asaba.











