Kelechi Iheanacho: Egwu erughi ya ụkwụ n'Afcon 2019
Aha ndị ga-aga Afcon2019 agbaala ka okwe

Ebe foto si, NFF/Twitter
Otu na-ahazị egwu bọọlụ na Naịjrirịa bụ Nigeria Football Federation ewepụtala aha ndị ga-anọchite anya ndị Naịjirịa na asọmpị TotalAfcon 2019 a ga-agba na Ijipt ga-ebido n'ụbọchị iri abụọ na otu nke ọnwa Juun.
Aha Kelechi Iheancho esoghị na ya bụ akwụkwọ NFF depụtara na ọbaozi Twitter.
Aka ndị uweojii akparala ndi FRSC n'Onitsha

Ebe foto si, AFP
Aka ndị uweojii n'Anambra steeti akpara ndị ọrụ Road Safety n'Onitsha maka ịtọgbụ onye otu ha aha ya bụ Emeka Ojei.
Akụkọ anyị nụrụ kwuru na Ojei kpọrọ ekwo nkụ ịfụ opi megide mpụ na ngarị ọ sị na mmadụ abụọ ahụ mere.
PHCN akwadoolaịgba gọmentị akwụkwọ

Ebe foto si, AFP
Ụnụ anụla e na ndị ọrụ Power Holding Company nke Nigeria mechiri emechi agbakwurula onye okikpe maka ịgba ụlọọrụ Bureau for Public Enterprise akwụkwọ.
Onyeisi ndị otu a bụ Malam Hassan Gar gwara ndị ntaakụkọ na Bauchi taa na ndị otu ha ejikerela ịgba gọmenti akwụkwọ maka ụgwọ eji ha.
Ngagharịiwe na Hong Kong
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
N'ofesi e, ngagharịiwe na-aga n'ihu ugbua na Honk Kong igbochi gọmentị ime iwu maka ịkpe ndị mmadụ ikpe na China karịa na Hong Kong bụ ebe ha bi.
Ndị Hong Kong na-atụ egwu iwu a ga-enye ohere ka China wee ike megide ndị ọchịchị na-amasịghị ha.
Akụkọ maka ịtụbata ahịa na Naịjirịa

Ebe foto si, PHILIP OJISUA
Onyeisi ụlọakụ etiti na NaỊjirịa bụ Godwin Emefiele ekwuola na mmadụ ọbụla maọbụ ụlọọrụ ọbụla ejidere na-ezobata ngwa ahịa na Naịjirịa ga-atakụta ya kọnkịrị
O kwuru na a ga-amachi ọbaego ndị ahụ iji kpaji ha nku n'ihi na nzobata ngwa ahịa so n'ihe na-eme na usoro ịwulite akụnaụba Naịjirịa ejighi amịta mkpụrụ.
Gọọmentị Nassarawa nọ na mmiri ọkụ
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
Otu ụlọikpe na Nassarawa agwaala gọọmentị steeti ahụ ha kwụghachi ụlọ mgbasaozi Breeze Fm ihe ruru nde naira iri isii n'ọma maka ụlọọrụ ha akwaturu n'afọ 2017.
Okaikpe Rose Soji nyere ikpe kwuru na atụmatụ gọọmentị ahụ megidere akwụkwọ iwu Naịjirịa ma kwuo na ha ga-arịọ Breeze Fm mgbaghara n'ihu ọha.
Na mba Sudan,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
Otu jịkọtara ndị ọchịchị onyekwuouche ya akpọọla oku ka ndị mmadụ ghara iwu debere ala ahụ dịka mmadụ karịrị iri atọ na-eme ngaghrị iwe nwụrụ n'aka ndịagha ala ahụ.
Cheta na ọgbakọ mba Afrịka bụ AU mapụrụ mba Sudan n'etiti ha rue mgbe ha ga-etinye onyeisiala ziri ezi.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
Onye nchịkọta otu Super Falcons bụ Thomas Denerby agwaala ndị mmadụ ha adana mba n'okwukwe ha nwere n'otu Naịjirịa.
Denerby kwuru nke a n'agbanyeghi na mba Norway jị ọkpụ atọ asataghị otu merie ha n'asọmpị mbụ ha na njem iko mba ụwa ụmụnwaanyị.











