Election petition tribunal: Ọkaikpe Garba eburula oche n'ikpe Atiku na Buhari

Ebe foto si, Getty Images
Ahọpụtala ọkaikpe M.L Garba nke ụlọikpe dị na Legọs dịka onye ga-achabi ikpe ntuliaka dị n'etiti onyeisiala Buhari na Atiku Abubakar nke PDP.
Ọ ga-anọchi anya ọkaikpe Zainab Bulkachuwa bụ onyeisi ụlọikpe nkpegharị bụ 'Appeal' na bekee.
Cheta na Bulkachuwa sepuru aka n'ikpe a n'ọwa gara aga n'ihi ebubo PDP boro na o nwereike ime nrụrụaka n'ikpe dị n'etiti Buhari na Atiku.

Ebe foto si, Getty Images
Onyeisiala Muhammadu Buhari ezigarala ndị Sokoto steeti ozi itiakanobi dịka ndị abalị dị egwu wakporo obodo ise na steeti ahụ ma gbuo ihe ruru mmadụ iri ise.
Ebe ndị uweojii kwuru na ha anwụchiela mmadụ anọ echere na aka ha dị n'ogbugbu a.
Obodo ebe o metụtara bụ okpuruọchịchị Isa nke dị na Sokoto steeti.
Ọgbaghara jupụtara na ntuliaka 2019 - Human Rights Watch

Ụlọọrụ Human Rights Watch na-ahụ maka ike ruru onye, kwuru na ọgbaghara na ogbugbu ndị mmadụ ahụrụ na ntuliaka afọ 2019 karịrị akarị.
Ha kwuru na ọtụtụ n'ime ha bụ nke ndị agha na ndị uweojii mere ma kpokuo onyeisiala Buhari ka ọ hụ na e chekwara ikike dịrị mmadụ na Naịjirịa.
Ụlọọrụ a kwuru na oge ntuliaka ka ndị Boko Haram, ndị ọchị ehi nakwa ndị ohi gburu ọtụtụ ndị mmadụ na mpaghara Naịjirịa gbaagburu gburu.
Ọzọ,

Ebe foto si, @Crevo360_Ng
Onyeisiala Muhammadu Buhari anabatala akwụkwọ ezumike nka nke Walter Onnoghen dịka onye ọkaikpe kachasị na Naịjirịa ma kelee ya maka ọrụ niile ọrụọrụ n'ala Naịjirịa
Cheta na akwụsịburu Onnoghen ọrụ n'ike maka ebubo izochi akụnaụba ya n'ebe gọọmentị nọ.
N'akụkọ yiri ya
Ogbunigwe agbaala ụgbọala ndịagha Amerịka na mba Naịja dịka ha na-eme ọmụmụ n'ebe ahụ.
Mba Amerịka ekwuola na o nweghi onye nwụrụ na ya bụ ọdachi mana ha nae-eme ndị agha ahụ nyocha.
N'egwuregwu,
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
Cristiano Ronaldo na ndị otu ya nke mba Portugal ji otu ọkpụ goolu merie mba Holland iji buli iko n'asọmpị UEFA Nations League.









