Etu anwụrụ igwe na-enye ọkụ siri gbuo mmadụ isii gara ịgbankwu n'Imo - Ndị uweojii

Aha onyonyo, Ihe Godson Ikeokwu kwuru maka ọdachị mere na Mbieri

Mmadụ isii nọ n'ụlọ a nọ gbaa nkwụ nwaanyị n'Ụmụeze ndị n'Ụmụọmụmụ nke Mbieri dị n'okpuruọchịchị Mbaitoli nke Imo steeti, alaala mmụọ site n'anwụrụọkụ igwe na-enye ọkụ e busara n'ime ụlọ.

Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii n'Imo steeti bụ Godson Orlando Ikeokwu, gwara BBC Igbo na ọ bụ ụnyaahụ bụ ụbọchị nke itoolu n'ọnwa Juun ka a gbara nkwụ nwaanyị ọdachị a sotere.

"Ọ bụ n'ụtụtụ a ka otu nwoke aha ya bu Herbert Uzoegbu bu onye Ụmụeze Mbieri, gara ụlọọrụ ndị uweojii dị na Mbieri gaa gwa ha na ya gara be nwanne ya nwoke ha nọ gbachaa nkwụ nwaanyị ụnyaahụ n'ụtụtụ mana ka ọ hụrụ na onwebeghi onye kuliri, o were lawa.

"Ka ọ kụrụ elekere asaa, ọ laghachị ma hụkwa na onwebeghi onye pụtara, nke mere o jiri kpọwa n'ekwentị. Ka mmadụ asaghị ya, o wee gbakaa ụzọ, hụ ka ndị niile nọ n'ụlọ ahụ tọgbọ ka ha anwụrụ anwụ."

Ikeokwu gara n'ihu gwa BBC Igbo na-eburu ndị nọ n'ime ya bụ ụlo ruru mmadụ iri abụọ n'itoolu gawa ụlọọgwụ, ebe ndị dọkịnta kpebiri na mmadụ isii anwụọla.

Ọ sị na mmadụ iri abụọ na atọ ka nọ na-agba mgba ọnwụ na ndụ.

Theresa Onyekaiheya bụ onye Mbieri gwara BBC Igbo na ọ bụ mmadụ iri ka ya ma nwụrụ n'ọdachị a, ma na-ekwukwa na akukọ na-ekwu na ndị nwụrụ karịrị.

Gee ọnụ Onyekaiheya ebe a.

Aha onyonyo, Ihe anya hụrụ gwara BBC Igbo maka ọdachị Mbieri

Agbanyeghị na Ekeokwu kwuru na ha ka na-eme nchopụta maka ihe a mere, mana o kwukwara na ahụrụ igwe na-enye ọkụ latrik n'ime ụlọ ahụ.

Igwe na-enye ọkụ latrik na-emepụta anwụrụ Bekee kpọrọ "Carbon Monoxide" bụ ihe na-egbu mmadụ, ọkachasị ma ya bụrụ na ọ dị n'ime ụlọ.