National Assembly: Ndị Igbo akwụọla ụgwọ kwesiri inye ha oke ha n'ụlọomeiwu - Sịnetọ Adighije

Sịnetọ Chris Adighije

Ebe foto si, Chris Adighije

Ndị isi okpokpo nọ n'APC nke Abia Steeti mere nzuko ma kwekọrịta ịkwado Orji Uzor Kalu na Nkiru Onyejeocha ịzọ ọkwa n'ụlọomeiwu Naịjirịa.

Nzukọ a bụ nke ha mere n'ụlọ Orji Uzor Kalu dị n'Igbere Abia State ka ha nọ kwado Kalu n'ịzọ ọkwa dịka Osote onyeisi sịnetị na Onyejeocha n'ịzọ ọkwa onyeisi ụlọ nnọchite anya.

Onye kachiri okwu na nkwekọrịta a bụ onyeisi ime obi pati APC nakwa sịnetọ nọchiburu anya Abia Central bụ Chris Adighije.

N'ajụjụ BBC Igbo gbara ya, sịnetọ Chris Adighije kwuru na ihe mere ha jiri mee nke a bụ ka Ndigbo soro keta oke n'ọchịchị a dịka mpaghara ndị ọzọ na Naịjiria.

O kwuru na ebe ọ bụ na onyeisiala si na mpaghara Ugwu, osote ya si na Ọdịda-Anyanwụ na o kwesịrị ka Ndigbo họpụta onyeisi Sinetị ma ọ bụ osote onyeisi Sineti nakwa onyeisi ụlọnnọchite anya.

Ụlọomeiwu nke Naịjirịa

Ebe foto si, Getty Images

O gara n'ihu kwuo na " Ndigbo akwụọla ụgwọ ha site n'ịchụ aja n'agha a lụrụ oge gara aga, ekwesiri inye ha ihe ruru ha".

Adighije kwuru na mmadụ abụọ a ha na-akwado bụ Orji Uzor Kalu na Nkiru Onyejeocha bụ ndị katara ahụ maara nke egwu na-akụ n'Ụlọomeiwu Naịjirịa.

Cheta na Orji Uzor Kalu bụbu gọvanọ Abia Steeti nwetara mmeri ntuliaka afọ 2019 ịnọchite anya mpaghara Abia-North n'Ụlọomeiwu dịka onye Sịnetọ.

Ebe Nkiru Onyejeocha nwetara mmeri ịnọchite anya mpaghara Isuikwuato/Umunneochi nke ugboro anọ n'Ụlọomeiwu dịka onyennọchiteanya.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị: