Alex Otti: Aga m enyocha Ikpeazu na ndị otu ya

Ebe foto si, Otti/ Ikpeazu
Gọọmentị Abịa steeti azachiela Alex Otti bụ onye ji ọkọrọtọ APGA azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ na okwu ya na ya ga-enyocha nrụrụaka mere n'oge ọchịchị Gọvanọ Okezie Ikpezụ ma ya banye n'ọchịchị.
Otti kwere ndị Abia nkwa na ngwa ngwa ya rigoro n'oche dịka gọvanọ na ya ga-enyocha ka gọọmenti Okezie ikpeazu nọ ugbua siri rụọ ọrụ.
Otti onye kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị pati okwu na mmemme ọsọ nta vootu APGA mere n'ụmụahịa gwara ndị Abia ka ha tụnyere APGA akwụkwọ na ntụliaka na-abịa iji nweta ụdị ezi mgbanwe dị n'Anambara steeti ebe APGA nọ n'ọchịchị.

Ihe ndị ọzọ Otti kwuru
Alex Otti gara n'ihu kwuo na abịa bụ obodo kacha alaghachi azụ na mmepe obodo na mpaghara ọwụwa anyanwụ Naịjirịa ma kwee nkwa na ọchịchị ya ga eme Abịa steeti otu n'ime obodo eji ama atụ n'ụwa niile.
O kwuru na isi okwu ndọrọndọrọ ọchịchị ya n'oge ugbua bụ"Ozuola bụ na Ozuola" nke pụtara "enough is enough" n'olu bekee.

"Ozuola" ahụ bụ nke ọkọwara dịka na ndaghachi azụ Abia state adịghị ya mma n'obi.
Ihe Ikpeazu sara ya
Mana na nzaghachi, Okezie Ikpeazu kwuru na egwu nyocha anaghị atụ ya, kama Otti buru ụzọ nyocha ije ya na ndị chịrịla steeti ahụ oge gara aga.
Ikpeazụ onye kwuru nke site n'ọnụ Kọmishọna Mgbasaozi Abịa steeti bụ John Okiyi Kalu.
Ọ sị : "Egwu nyocha anaghị atụ anyị. Ọ bụrụ na ọ ga-enyocha, ya bido n'onwe ya, n'oge ya na ndị chịrịla steeti a tupu Ikpeazụ abata."
Ihere mere n'ọsọ achụnta vootu ahụ
Ndị otu pati All Progressives Grand Alliance bụ APGA n'aha ịchafụ malitere ịchụ nta ndọrọndọrọ ọchịchị n'Abia steeti n'uju na mmemme ahụ.
Ọtụtụ ndị ịsị pati APGA bịakwara n'ịsị obodo Abịa bụ Umuahịa iji gosi nkwado ha.

APGA chịkọbara mmemme ọsọ nta vọọtụ na Catholic Field, Ubakala Road Umuahia ebe puku kwụrụ puku ndị pati ahụ zukọrọ iji gosi nkwado ha.
Onye osote gọvanọ Anambra steeti bụ Nkem Okeke kpọkuru ndị Abia ka ha tụnyere APGA akwụkwọ ka mmepe were bata na be ha.
Nkem okeke ji Anambra maatụ, kwuo na ọ na ebu ụzọ n'ihe niile tata n'ihi na APGA nọ n'ịsị oche.

Ọtụtụ ndị jị aha APGA azọ ọchịchị bụ ndị enyere ọkọlọtọ pati ahụ gosiri na ọ bụ ha ka patị nyere INEC aha ha.










