PDP Primaries: Ikpeazu ga-anọchite anya ha na ntuliaka 2019

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-ekwu na ahọpụtara Okezie Ikpeazu dịka onye ga-anọchite anya ndị PDP na ndọrọndọrọ ọchịchị 2019.
Onye ntaakụkọ BBC nọ ebe a gụkọrọ akwụkwọ e ji mee ya bụ ntuliaka imeụlọ, kwuru na Ikpeazu nwetara vootu 1991 n'ime 2207 a tụkọtara.
Dịka o si gaa, a gụkọrọ akwụkwọ vootu ole a tụtara na ntuliaka imeụlọ ndị PDP Abịa steeti n'ọgbọ egwuregwu 'Umuahia Township stadium' ebe a nọ mee ya bụ ntuliaka.

Ndị PDP nke Abịa steeti ji obiọma ha niile mee ntuliaka imeụlọ maka ịhọpụta ndị ga-eso zọọ ndọrọndọrọ nke 2019.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Igbo si weta akụkọ, ndị ọnụ na-eru n'okwu na PDP Abịa steeti pụtara n'igwe ịhụ na ntuliaka a gara nke ọma.

Ndị dịka Omeiwu Enyinnaya Abaribe, Omeiwu Mao Ohuabunwa, T.A Orji na ndị ọzọ pụtara bịa tụnye akwụkwọ ntuliaka ha na ya bụ ọgbakọ.



Ka o si gaa n'Enugwu steeti
Akụkọ na-eru anyị ntị na-akọwa na PDP ahọpụtala Ifeanyi Ugwuanyi a na-etu 'Gburugburu' dịka onye ga-anọchite anya ha na ntuliaka 2019.

Osote onyeisi ụlọomeiwu ukwu bụ Ike Ekweremadu kpọpụtara Ugwuanyi, ma jụọ ma o nwere onye ọzọ ha chọrọ ka ya na ya zọọ ya bụ ọkwa, ha sị mba.
E debanyere aha ya dịka onye ga-azọ ọkwa naanị ya.


Ebe foto si, BBC
Onye ntaakụkọ BBC kwuru na ndị PDP gbakọtara n'ọgbọegwuregwu Nnamdi Azikiwe (stadium) ji otu obi bịa.

Nke pụtara na enweghi onye lụrụ ọgụ maọbụ baa mba.

Akụkọ ga-amasị gị:









