APC Primaries: Eyigharịala nke Abia state

Aha onyonyo, Otu pati APC Abia steeti agbakọla aka họpụta Buhari maka ndọrọndọrọ ọchịchị 2019

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na eyigharịrị ụbọchị ntuliaka imeụlọ APC n'Abịa steeti makana ndị otu ha si Abuja erutebeghi.

Onyeisi otu APC nke Abia steeti bụ Donatus Nwamkpa, kwuputara nke a ka ya na onye ntaakụkọ BBC kwuru n'ekwentị.

Ndị APC Abia steeti gbakọtara aka họpụta Onyeisiala Muhammadu Buhari dịka onye ha chọrọ ka ọ nọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.

Ọkammụta Chris Nwamuo gụpụtara aha Buhari ebe ha na-eme ntuliaka imeụlọ taa n'Ụmụahịa, Abịa steeti.

Nkechi Nwogu bụ onye omeiwu nọchiteburu Abịa Sentralụ so na ndị isi a hụrụ kwaba okpu bịara n'ọgbakọ ahụ a nọ kpọpụta aha Buhari.

Nkechi Nwogu
Nkọwa foto, Nwogu bịara ọgbakọ a n'agbanyeghi na ọ naghị azọ ọkwa na 2019

Nyerere Anyim so na ndị isi n'otu APC n'Abịa na ndị ọzọ gbakọtaranụ kwuru na Buhari dị ha mma n'obi, ma kwuo na ọ na-arụ ọrụ a hụrụ anya, sị ka ọ rụrụ gawa n'ihu.

Ndị APC
Nkọwa foto, Nyerere na ndị otu APC ọzọ chọrọ ka Buhari zọọ ọkwa ọchịchị ọzọ

Akụkọ na-eru BBC Igbo ntị na-akọwa na anwụchiela ụfọdụ ndị butere ọgbaghara n'ọgbakọ ntuliaka imeụlọ APC.

Aha onyonyo, APC Primaries: Ọgbaghara dapụtara n'Enugwu

Na ọgbaghara dapụtara emeghi ka ndị mmadụ kwakọrọ lawa be ha, makana akụkọ kwuru na ntuliaka ndị mmadụ ji maka ya bịa ka ga-aga n'ihu.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo nọ n'Enugwu steeti ugbua zitere foto a na-egosi na ntuliaka a ga-ebido n'oge na-adịghị anya.

Akwụkwọ ntụlịaka imeụlọ Enugwu steeti

Otụtụ ndị nche obodo pụtara maka ntuliaka a.

Ntuliaka imeụlọ APC na Enugwu
Nkọwa foto, Ndị nche a pụtara n'Enugwu
Ntuliaka imeụlọ APC na Enugwu
Nkọwa foto, Ndị ga-ebinye aka eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a n'Enugwu

APC n'ime Kano steeti ebidola ntuliaka imeụlọ nke ha.

Ọtụtụ ndị otu ha apụtaala maka ntuliaka nke taa.

Ntuliaka Kano
Nkọwa foto, Ndị otu APC na Kano

Ngwa ọrụ ha ga-eji were mee ntuliaka eruola wọọdụ dị iche iche na Kano maka ntụlịaka imeụlọ a.

Ntuliaka Kano

Ngwa ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti eruola ebe ha ga-eme ntuliaka a.

APC Materials

PDP dị njikere

Ọ bụghị sọọsọ APC na-eme ntụlịaka imeụlọ.

Ndị otu PDP agbakọọla n'Okpara square ebe ha ga-eme ntuliaka ha.

Onye ntaakụkọ BBC Igbo na-ekwu na puku karị puku mmadụ bụ ndị gbakọrọ n'ebe ahụ.

Ndị otu PDP

Ka o si dị ugbua n'Enugwu, ha ka na-elebe anya n'akwụkwọ ka ha ma ndị ga-eso na ntuliaka nke taa.

Ntuliaka imeụlọ PDP na Enugwu

Ndị otu APC apụtala na ọgbọ egwuregwu Adamasingba n'ime Ibadọn bụ isi obodo Oyo steeti.

Ha na-eche mgbe ha ga-ebido ịchọpụta ndị dere aha na akwụkwọ maka ntụliaka a.

Ndị Oyo apụụla maka ntuliaka ime ụlọ a
Nkọwa foto, Ndị Oyo apụụla maka ntuliaka ime ụlọ a

N'Abia steeti, ndị otu PDP kwuru n'ịrọ ọgbọ egwuregwu nke Umuahia isi obodo Abia steeti ebe ha ga-eme ntuliaka imeụlọ nke steeti ha taa.

Ntuliaka imeụlọ PDP na Abia steeti

BBC Igbo na-ewete ozi na o nwere ndị ji akwụkwọ ikike adigboroja maka ntuliaka imeụlọ nke APC n'Enugwu steeti.

Ha ekweghị ka ha bata n'ebe a na-eme ntụlịaka a.

Ntuliaka imeụlọ APC na Enugwu
Nkọwa foto, Akwụkwọ ikike adigboroja

APC na-akọwa na nke a bụ nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike ntuliaka imeụlọ nke APC.

Ntuliaka imeụlọ APC na Enugwu
Nkọwa foto, Nke bụ ezigbo akwụkwọ ikike

Akụkọ ka na-abịa.