Ihe nwere ike imebi ntuliaka 2019 Naịjirịa - Otu USAID

Ebe foto si, Getty Images
Otu sị mba ofesi na-elebanya na nkwadebe ntuliaka Naịjirịa nke afọ 2019 na-ekwusike na egwu na-atụ ha gbasara nkwadeba Naịjirịa maka ntuliaka 2019.
Otu sị International Studies (Congo), Information Resources Incorporated IRI (USA) nakwa ọtụtụ ndị ọzọ Bekee kpọrọ Election Observers akpọọla ndị ọrụ Naịjirịa dị iche iche na-eleba anya maka nkwadebe ntuliaka 2019 maka ihe a na-amaja ha obi.
Otu a kọwara na ọ bụ nglaba United States Agency for International Development (USAID) bụ ndị zipu ha n'ọrụ a.
N'ime akwụkwọ ozi ha zipuru ndị ntaakụkọ ha kọwara ihe ndị a niile.
Ihe achọpụtara
Ha kọwara na achọpụtala na Naịjirịa ka nwere nsogbu gbasara ịwepụta ego ga-agba mbọ hụ na ntuliaka ga nke ọma.
Ọzọ bụkwa na nchekwa ala akwụsịghị ike na nkwadebe ntuliaka a.

Ebe foto si, Getty Images
Ha kwụkwara na ha chọpụtara na ọtụtụ ndị ndọrọdọrọ ọchịchị na-eji ego azụ mbinyeaka ndị mmadụ na ntuliaka a.
Nke anọ bụ na ndị omekome ka nkụ ga-ebute ọgụ na nsogbu dị iche iche na ntuliaka 2019.
Ozi asị bu ihe ọzọ ha chọpụta. Ha kọwara na ozi dị iche iche na-apụta na social media nwere ike ibute nsogbu na ntuliaka 2019.
Ha kwukwara na ndị a na-akpọ 'god-fathers' na bekee n'ime otu ndọrọndọrọ dị iche iche bụ ndị ọzọ ga-ebute nnukwu nsogbu na ntuliaka 2019.

Ebe foto si, Getty Images
Nke ikpeazu bụ na mgbochi ụmụnwanyị ndị ntorobịa nakwa ndị nwere nkwarụ na ntuliaka 2019.
Mkpebi ha
Ha nyere ndụmọdụ na gọọmentị kwesiri iji ugbua bido ịlebe anya na ọtụtụ nsogbu a akpọpụta aha.
Ha rịọkwa ndị nta akụkọ na ọdịzị n'aka ha ka ha gba mbọ hụ na ọ bụ sọọsọ ozi nke bụ eziokwu bụ nke ha na-ezipu oge ọbụla.
Akụkọ ga-amasị gị









