Lagos Election: Ihe ndị Igbo na-ekwu maka Ambode na Sanwo-Olu

Ebe foto si, @AkinwunmiAmbode
Otu na-ahụ maka ndị gọvanọ na pati APC bụ Governor's Advisory Council (GAC) n'olu bekee kpebiri na a ga-eme ntuliaka ime ụlọ na Legọs Steeti iji họpụta onye ga-azọ ọkwa gọvanọ n'aha pati APC.
Ndị ga-azọ ọkwa a gụnyere gọvanọ na-achị Legọs steeti ugbua bụ Akinwunmi Ambode na onye bụbu direktọ ụlọọrụ na-ahụ maka mwulite obodo na legọs Steeti bụ Sanwo-Olu Babajide Olusola.
BBC Igbo gbara ụfọdụ ndị Igbo ajụjụ ọnụ banyere ntuliaka a ga-adị n'etiti Ambode na Sanwo-Olu.
Otu nwoke a kpọrọ Godwin Nwokpo si Ebonyi steeti kwuru na ọchịchị Ambode dị mma.
Ọ gara n'ihu kwuo ka ọ chizuo afọ anọ na-abịa abịa n'ihi na o nweghị onye chịrịla naanị afọ anọ.
Onye ọzọ na-achọghị ka-akpọ aha ya kwuru na ọchịchị Ambode dị mma karịa nke onye chịburu mbụ bụ Fashola.
N'okwu ya, "Ambode adịghị akpa oke agbụrụ n'ebe ndị Igbo nọ dịka Fashola ji mee n'oge ọ na-achị."

Ebe foto si, @officialAPCng
Ndị ọzọ na-achọkwaghị ka a mara ndị ha bụ gwara BBC Igbo na onweghi ihe ọjọọ Ambode mere kama na o mejọrọ nna ya ukwu bụ 'Bola Tinubu'.
Akụkọ kwuru na Akinwunmi Ambode na onye ndu pati APC bụ Ahmed Bola Tinubu nwere esemokwu nke mere Tinubu ji akwado Sanwo-Olu ị bụ gọvanọ n'afọ 2019.










