Imo Steeti: Ihe kpatara anyị ji gbagharịa Madumere akwụkwọ

Eze Madumere

Ebe foto si, Eze Madumere Facebook

Nkọwa foto, Eze Madumere na Okorocha anaghị esi otu ụzọ agafe
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 2

Gọọmenti Imo steeti ekwuola ihe mere ha ji aga ụlọikpe mkpegharị ịgbagha mkpebi e kpebiri iweghachite Eze Madumere dịka osote gọvanọ steeti ahụ.

Onye nkwuchiteọnụ gọvanọ Rochas Okorocha bụ Sam Onwuemedo, kwuru na ụlọikpe ahụ arụtụghị aka n'ebubo e boro Madumere e jiri chutuo ya kama ọkaikpe metụrụ aka naanị na ndị e kpokobara mere nyocha maka nchutu ahụ.

O kwuru na Okorocha enweghị ihe ọbụla o nwere megide Madumere maọbụ ọkaikpe kpere ikpe ahụ, kama na ọ bụ usoro iwu ka ha na-eso.

N'okwu ya; "Ọkaikpe ahụ kwuru na onyeisi oche kọmiti mere nyocha ebubo e boro Eze Madumere gafere oge e nyere mana o kwughị okwu gbasara ebubo e boro Madumere."

"Ndị na-eme mkpegharị a bụ ndị ikpe ahụ metụtara, gọvanọ Okorocha esoghị na ya."

Aha nkeananụānụ, Sam Onwuemedo

Cheta na ụlọikpe kpebiri na iwu akwadoghi usoro e jiri chutuo Madumere wee nye iwu ka ọ lọghachi n'ọrụ.

Eze Madumere gwara BBC Igbo ụnyaahụ na ya alaghachila azụ n'ụlọọrụ ya dịka osote gọvanọ.

Cheta na otu ụlọikpe n'Owere n'ụbọchị 25 nke Septemba 2018, kpebiri na iwu Naijirịa akwadoghi nchụda ndị ụlọomeiwu chụdara ya n'ọnwa Julaị nke afọ a.

Madumere gwara onye ntaakụkọ BBC na mkpebi pụtara n'ụlọikpe bụ naanị olileanya ndị nkịtị nwere n'ala Naịjirịa.

N'ọnụ okwu ya: "Anyị na-ebuso emume ịmaja mmadụ agha, mana olileanya m nwere n'aka chukwu nakwa iwu ala Naịjirịa butere mmeri a."

Madumere kwukwara na ọ na-ekele ndị Imo maka mmeri a makana ha so n'agha a butere mmeri a.

Ọ ga-ebute udo?

Kemgbe mkpebi a pụtara, ọtụtụ ndị mmadụ na-ekwuputa uche ha gbasara yabụ mkpebi.

Okorocha

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Okorocha ọ ga-anabata ya?

Mmadụ dịka @PrincessChi jụrụ ajụjụ na Twitter sị na nsogbu maliteren'ihi okwu a ọgwụla?

Skip X post, 1
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 1

Onye ọzọ bụ @Buchyogba jụrụ ajụjụ nke ya sị ma Okorocha ọ ga-anabata Madumere n'udo dịka osote ya?

Skip X post, 2
Hapụ X ihe dị na ya?

Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.

Warning: Third party content may contain adverts

End of X post, 2

Isi mbido nsogbu Madumere na Okorocha

Ọ bụ kemgbe Madumere gosiri ebumnuche ya iso zọọ ọkwa ọchịchị dịka gọvanọ Imo steeti ka okwu a malitere.

Cheta na gọvanọ Rochas Okorocha chụrụ kọmịshọna iri na atọ n'ime ọnwa a makana ha chọrọ ịzọ ọkwa dị iche iche n'Imo steeti.

Madumere gwara BBC Igbo mgbe ahụ na ebumnuche Okorocha bụ na onye ọbula chọrọ ịzọ ọkwa ọbụla kwesịrị iritu n'ọkwa o ji ugbua.

Akụkọ ga-amasị gị