A ga m ebu agha n'ụlọikpe maka nchụda m - Madumere

Eze Madumere

Ebe foto si, Eze Madumere facebook

Nkọwa foto, Eze Madumere na-agọ ebubo na onweghị mgbe ọbụla ya arụghị ọrụ ya ofụma dịka osote govanọ

Okwu ka dị na mkpebi pụtara ụnyaahụ n'Imo steeti ebe ndị ụlọomeiwu nke steeti ahụ chudara n'ike Eze Madumere dịka osote gọvanọ Imo Steetị.

BBC Igbo gbara odeakwụkwọ mgbasaozi Eze Madumere bụ Uche Onwuchekwa ajụjụọnụ gbasara nchụda a achụdara Madumere dịka osote gọvanọ Imo steetị.

Onwuchekwa kwusiri ike na Madumere ekpeela ikpe a n'ụlọikpe na kwa na ọ dị n'aka ndị okaikpe ịkabiri mkpebi a ndị ụlọomeiwu kpebiri.

N'ọnụ okwu ya, "Madumere ka bụ osote gọvanọ Imo steeti. Ihe mere bụ ka anyị jiri ndidi na-eche ka ndị okaikpe tinye ọnụ n'ike na ya bụ okwu."

O kwukwara na o riri ya ọnụ na ụlọikpe ala Naịjirịa mere mkpebi ka ndị omeiwu a kwụsị emume niile ha na-eme maka ịchụda Madumere dịka osote gọvanọ Imo steeti, mana ha egeghị ntị cha cha.

Gini butere mkpamkpa a?

ROCHAS OKOROCHA

Ebe foto si, ROCHAS OKOROCHA/TWITTER

Nkọwa foto, Okorocha

Akụkọ dị n'iro n'ekwu na nsogbu dị n'etiti Rochas Okorocha na Eze Madumere malitere oge Madumere bidoro ịnwe ebumnuche iso n'ịzọ ntụlịaka 2019 dịka gọvanọ Imo steetị.

Cheta kwa na Rochas Okorocha kwusiri ike n'azụ ọgọ ya nwoke bụ Uche Nwosu dịka onye ga-apụta dịka gọvanọ Imo steetị.

Mana ruo ugbua, gọvanọ Okorocha ka na-agọ na aka ya adịghị na nchụda a chụdara Madumere.

Udo ọ dị n'ịhụn'ọchịchị Imo?

Onwuchekwa kwuru na obi anaghị amapụ Madumere maka nchuda a a chụdara ya. Na ọ kwụsiri ike, nakwa bụ onye bụ osote gọvanọ na agbayeghị ihe ndị ụlọomeiwu kpebiri.

O kwuru,"O nweghị okaiwu ọbụla ga-adụ onye ọzọ dịka osote gọvanọ Imo steeti iyi ọrụ."

Akụkọ ga-amasị gị