Ogbaru: Ahụla ozu Okechukwu Osadebe bụ onye idemmiri gburu

Idemmiri

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Idemmiri emebiela ọtụ ihe na Naịjirịa n'afọ a

Ozi na-eru BBC ntị na-akọwa na ahụla ozu nwa onye egwu ama ama nke lagoro mmuo bụ Osita Osadebe bụ nke idemmiri gburu ụnyahụ bụ Fraịde.

Okechukwu Osadebe na mmadụ abụọ ndị ọzọ na-aga mgbe ya bụ idemmiri chịpụrụ ya ụkwụ n'ala, dịka nne ya bụ oriakụ Amaechi Osadebe sịrị kwuo.

Ụlọọrụ ntaakụkọ ABS kwuru an ya bụ ihe mberede mere n'abalị ụnyahụ mgbe enyeghị dị ya na Okechukwu so ohere ịzọpụta ya maka ka ya bụ idemmiri sị achị ọkụ.

Ha kwụkwara na onyeisi okpuruọchịchị ọgbarụ bụ Arinzechukwu Awogu emelarị njem itiaka n'obi n'ezinaụlọ Osadebe bụ ebe ọ nọ dọọ ndị mmadụ aka na ntị maka idemmiri.

Akụkọ ga-amasị gị

Aha onyonyo, Etu nwaanyi a si buru Igbo n'isi ga-atụ gị n'anya