Akụkọ dị mkpa: APC eyigharịala ntụlịaka imeụlọ ekwesiri ime tata
Akụkọ kachasị dị mkpa taa:
APC sịzị na ntụlịalaka imeụlọ bụzị echi

Ebe foto si, Getty Images
Ka ọ dị ụgbụa, otu APC ebughariela nhọpụta imeụlọ ha hibeburu Mọnde.
Ya bụ nhọpụta imeụlọ ga-abụzị echi ebe APC Imo steeti ahọpụtala onyeisiala Buharị dịka onye ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.
Onweghị onye ya na ya zọrọ ọnọdụ a na steeti ahụ.
Mgbe BBC Igbo gaara n'ulooru APC n'Enugu steeti imaata ihe na-eme ha kwuru na ọ ga-aga ihu echi, mana ha ekwughi oge o ga-amalite maọbụ ogige a ga-ano mee ya bu ntuliaka.
Ha kwuru na ndenye aha ndi eme ntuliaka nke bu "accreditation of delegates" ga-amalite n'elekere asato nke ututu n'Okpara square.
Nke a mere na ufodu n'ime ha agaghi aga uka
Nwa Osita Osadebe anwụọla n'idemmiri

BBC achọpụtala na-ezie na Idemmiri gburu Okechukwu Osadebe bụ nwa onye egwu, Osita Osadebe ụnyahụ.
Ahuru ozu ya na ụtụtụ tata bụ Satọde.
Aisha Jummai abanyela pati ọzo
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
Ka ọ dị ụgbụa, otu APC ebughariela nhọpụta imeụlọ ha hibeburu tata.
Ya bụ nhọpụta imeụlọ ga-abụzị echi ebe APC Imo steeti ahọpụtala onyeisiala Buharị dịka onye ga-anọchite anya ha na ndọrọndọrọ ọchịchị nke 2019.
Onweghị onye ya na ya zọrọ ọnọdụ a na steeti ahụ.
West Ham emeriela Man. U 3-1

Ebe foto si, Getty Images
N'egwuruegwu, West Ham ewerela ọkpụ atọ asatara otu (3 - 1 )nyụọ ndị Manchester United anya na asompi premier League tata.
Rashford nke Man. U ji otu ọkpụ ahụ gbara isi onwe ya.
Ogbugbu ndị Naịjirịa na Ghana
Buhari na onyeisiala Nana Akufo Addo nke Ghana zutere ebe ha kpara maka ihe ndị Naịjirịa na-azụ ahịa na mba ahụ na-agabiga.
Addo kasiri ya obi ma gwa ya na amaghị ama awakpo ndị Naịjirịa.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
N'akụkọ yiri ya,
Onyeisiala Muhammadu Buhari ebunyela Tony Iwobi bụ onye isiojii mbụ bụ onye omeiwu na mba Italy ụkpa ekele maka ọkwa ya.

Ebe foto si, Twitter/APCNigeria
N'akụkọ ọzọ,
Gọọmentị Plateau steeti amachiela ndị mmadụ ịpụta ezi site n'ụtụtụ ruo n'abalị na mpaghara ugwu na ndịda Jos dịka e gburu mmadụ iri na anọ n'ụlọ n'obodo Rukuba na steeti ahụ.
Na mba ofesi,
Ihe ruru mmadụ iri atọ anwụọla n'ihe mberede alaọmajijiji n'obodo Palu dị na mba Indoneshia.

Cheta na alaọmajijiji a kpakwara mkpamkpa n'obodo Lombok dịkwa na mba ahụ ebe o gburu ihe karịrị mmadụ narị anọ na iri isii.
N'egwuregwu,
Chelsea na Liverpool ga-akwakọta mpi na mgbede taa na Premier League.

Ebe foto si, Getty Images
Cheta na Chelsea ji ọkpụ abụọ asatara otu gbapụ Liverpool n'asọmpi Iko Carabao oge ha zutere ụbọchị abụọ gara aga.
Gere akụkọ ndị a n'otu nkeji:
Lee ihe nkiri nke taa:
Nwaanyị onyeọcha na-asụ Igbo karia ufọdụ ndị Igbo ekwuola ka o si wee mụta asụsụ Igbo n'ụzọ dị mfe.













