Sinetị akwụsịla akwụkwọ iwu ga-awụgharị usoro ntuliaka

Saraki na Ekweremadu

Ebe foto si, Nigerian Senate/ Facebook

Nkọwa foto, Onyeisi sineti bụ bukola Saraki anọghị oge mwakpo ahụ mere

Akwụkwọ iwu ahụ nke chọrọ iwegharị usoro ntuliaka kwadoro ịgafe agba ọgụgụ nke abụọ na sinetị mana o nwere ọgbatauhie dịka ọtụtụ ndị omeiwu rụtụrụ aka n'akụkụ dị icheiche n'akwụkwọ iwu ahụ nke ha kwauru nwere ntụpọ.

Ndị omeiwu ahụ kwekọrịatara ka ahapụgodi yabụ iwu ma gwa otu kọmịtị na-ahụ maka ntuliaka ka ha wepụ akụkụ ebe ndị ahụ na-edoghi anyị nke mere na onyeisiala Muhammadu Buhari ebinyeghi aka na ya.

Akụkụ ndị onyeisiala kwadoro, a ga-eweghachiri ya ka o binye ya aka.

Akụkọ ka na-abịa...

Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line