Ihe chụrụ Kenneth Okonkwo n'ọsọ ọkwa gọvanọ Enugu steeti

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo Facebook
Kenneth Okonkwo bụ onye a ma ama na ihe nkiri Nollywood chọburu ịba na ndọrọndọrọ ọchịchị mana ụkwụ akpọla ya.
Okonkwo chọburu ịzọ ọkwa ọchịchị na ntuliaka 2019 n'okpuru pati APC n'Enugwu mana akụkọ pụtara na-ekwu na ọ gbaghị akwụkwọ e ji agba ya bụ ọsọ.
Otu onyeisi na pati APC n'Enugwu bụ Ebubeagụ Okafor gwara BBC Igbo n'ezie Okonkwo esoghị na mmadụ isii ga-azọ ya bụ ọkwa ụbọchị Septemba 30.
Okafor kpọpụtara aha ndị gbara akwụkwọ ịzọ ọkwa gọvanọ n'okpuru pati APC n'Enugwu bụ ndị a:

1. Ayogu Eze
Eze bụ onye Igboese Nọt na Nsukka, ọ zobuola ọkwa gọvanọ n'Enugwu n'afọ 2015 mana Ifeanyi Ugwuanyi meriri ya.
Ọ gara ụlọikpe rue na ụlọikpe ukwu Naịjirịa mana Ugwuanyi merikwara ya wee bụrụ gọvanọ na-achị Enugwu ugbua.
Eze chọkwara ịpụta zọọ ọzọ ma ọ bụrụ na o nweta akwụkwọ ikike ndị pati ya na ntuliaka imeụlọ ha ga-eme.
2. Ifeanyi Nwoga

Ebe foto si, Nwoga
Nwoga bụ onye Agbani n'okpuru ọchịchị Nkanụ dị na Enugwu Ist.
Nwoga bụ onye ọkaikpe so ndịisi ụlọọrụ nwoga and Associates. Ọ bụbu ọkaipke ukwu nke Enugwu steeti tupu ọ tinyebe anya na ndọrọrndọrọ ọchịchị.
3. Akubue Augustine
Akubue bụ dibia Bekee ma bụrụ onye Igboetiti na Nsukka.
Ọ ruburu ọrụ n'otu mbaụwa United Nations ihe ruru afọ iri na anọ.
4. Benjamine Eche
Eche bụ onye Ọgwụ dị n'okpuru ọchịchị Ọgwụ n'Enugwu steeti.
5. Ejike Ugwu
Ugwu bụ onye Igboetiti dị na Nsukka.
6. Geroge Ogara
Ogara bụ onye ọkaiwu ma bụrụkwa Igboeze Saụt dị na Nsukka, Enugwu steeti.

Kedụ ebe Kenneth Okonkwo nọ?

Ebe foto si, Kenneth Okonkwo/Intagram
Dịka otu onyeisi n'otu pati APC n'Enugwu bụ Ebubeagu Okafor si gwa BBC Igbo, o kwuru na etu ọdị ugbua, Kenneth Okonkwo esoghizi na ndị na-azọ ndọrọndọrọ maka ọkwa gọvanọ n'Enugwu.
Okafor kwuru na nke a bụ maka na Okonkwo agalighi akwụkwọ e ji egosi ebumnobi ịzọ ọkwa ahụ n'ihi ego adịghị.
N'okwu ya; "Kenneth Okonkwo na-eme ihe egwuregwu, ọ pụa si na ya chọrọ ịzọ gọvanọ, a kụọrọ ya aka.
"O ruzie mgbe a ga-agba 'form', a chịta 'form' chịgara ya, gwa ya ego ole e ji agba ya, mana ya bụ nwa okorobịa gosiri na akọwasirọrị ya nkeọma.
"Mana oge akwụkwọ pụtara, e wegara ya akwụkwọ ka ọ gbata, mana ya bụ nwokorobịa gosiri na a kọwaghịrị ya ọfụma ihe ịzọ gọvanọ bụ.
"Nke bụ na o gosiri na o jighi ego ịgab 'fọrọm' ahụ. Onye na-ejighi ego, ekwela ebule ọnụ."
BBC Igbo kpọrọ Kenneth Okonkwo ka ọ zaghachi okwu a mana o zaghị oku.
Mana onye ndụmọdụ ya n'ihe gbasara mgbasaozi bụ Emmanuel Anabueze kwuru na Okonkwo bụ n'izu na-abịa ka ọ ga-agwa ndị ntaakụkọ okwu ihe mere o jiri na-azọghị ọchịchị ahụ ọzọ.

Ego ole bụ akwụkwọ fọm ahụ?
Dịka otu APC si kwuo na mbụ, ha kwuru na ha wedatara ego ole e ji agba akwụkwọ nkwupụta maka ịzọ ọchịchị maka ntuliaka 2019.
Lee ego ole ọ na-ada
1. Ọkwa onyeisiala - Nde naịra iri anọ na ise (N45m)
2. Ọkwa gọvanọ - Nde naịra iri abụọ na puku narị ise (N22.5m)
3. Ụlọomeiwu sintei - Nde naịra asaa (N7m)
4. Ụlọ nnọchiteanya - Nde naịra atọ na puku narị asatọ na ise (N3.85m)
5. Ụlọomeiwu nke steeti - Puku naịra narị asatọ na iri ise (N850,000)












