Jim Iyke ọ dabara na nsogbu ndị uweojii?
Akụkọ pụtara ugbua na-ekwu na ndị uweojii nke ọdọ ụgbọelu Murtala Mohammed na Legọs anwụchiela Jim Iyke bụ omeiheonyonyo.
Dịka ụlọọrụ ntaakụkọ Punch siri kwuo, anwụchiri ya mgbe ọ mara onye ụlọọrụ ọla mgbe ọ na-achọ ị me ya nyocha.
Edemede a nwere ihe ndị si na Instagram. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ Instagram iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of Instagram post
Ndị nọ ebe ihe mere kwuru na ọ mara nwoke ahụ ọra ebe ọ na-achọ ịnyere ya aka mee ọsịsọ banye n'ụgboelu njem ya tupu ihe a eme.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị ụlọọrụ Dana Air bụ Kingsley Ezenwa kwuru na ihe a mere ma kwuo na atọghapụọla Jim Iyke dịka ọ rịọrọ biko.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii na ọdọ ụgbọelu bụ Alabi Joseph kwukwara na atọghapụọla ya bụ omeiheonyonyo.

Ebe foto si, @jim.iyke/Instagram
Jim Iyke agaghịzi njem ya n'ihi okwu a.




























