Ihe mba Afrịka ndị ọzọ ji kara Naịjirịa mma n'ihe nkiri

Akpụrụakpụ ihe nrite Oscars

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, 2018 a mere ya afọ 90 a na-eme nturugo Oscars na Hollywood

Ka emechara Oscars nke bụ emume nturugo kachasị ada ụda n'ụwa ihe nkiri nke 2018, BBC Igbo nyochara ma hụ na mba Afrịka ndị ọzọ ka Naịjirịa mma n'ihe gbasara ihe nkiri.

BBC chọpụtara na n'agbanyeghị na ụfọdụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naịjirịa na-etinye ụfọdụ ndị Hollywood n'ihe nkiri ha, o mebeghị ka ha soro na ndị a na-akpọ aha inweta nturugo ọbụla na Hollywood.

Nollywood bụ ndị na-emepụta ihe nkiri na Naịjirịa na mpaghara Afrịka ndị ọzọ so na ndị a na-anụ aha ya, ndị mba Afrịka ndị ọzọ egosila ha nkarị.

Lupita Ngong'o

Ebe foto si, AFP

Nkọwa foto, • Lupita Nyong'o bụ nwaafọ Kenya bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2013

N'afọ ole na ole gara aga, a na-ahụbụ Naịjirịa dịka 'dike' n'ihe nkiri n'Afrịka, mana ugbua, ọ dị ka ndị ọzọ agaferela ha.

Ebe Nollywood n'onwe ha bụ ndị nọ n'ọkwa abụọ n'ụwa ihe nkiri na-emepụta ihe nkiri karịrị 1000 n'ime otu afọ, Hollywood na-emepụta ihe na-erughị nke ahụ mana ọkwụsịghị ha ịbụ ndị ụwa niile na-ele anya na ha kacha emepụta ihe nkiri kacha mma.

Mana abịa n'ime Afrịka, mba Kenya na Saụt Afrịka na-egosi Naịjirịa nkarị ebe ọ gbasara ihe nrite sitere na nturugo Oscars.

Akara ntụ-ntụ

N'isi n'isi

Saụt Afrịka

  • Nanị Saụt Afrịka nweterela ihe rite maka 'ihe nkiri kacha mma ndị mba ofesi mere' akpọrọ Tsotsi
  • Ha nwetara ihe nrite a n'afọ 2005
  • Nanị Saụt Afrịka bụ mba Afrịka nwere ndị a kpọrọla aha inweta ihe nkiri (nominate) ugboro itoolu
  • Charlize Theron bụ nwaafọ Saụt Afrịka bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha eme ihe nkiri' n'afọ 2004 maka ihe o mere n'ihe nkiri akpọrọ Monster

Kenya

  • Lupita Nyong'o bụ nwaafọ Kenya bi n'Amerịka nwetara ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2013 maka ihe o mere n'ihe nkiri a kpọrọ '12 Years a Slave'
  • Mark Peploe bụ onye Kenya nwetara 'Academy Award for Writing Adapted Screenplay' n'olu bekee maka ihe nkiri a kpọrọ, 'The Last Emperor'.

Naịjirịa

  • Chiwetel Ejiofor bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Britain so na ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite 'nwoke kacha eme ihe nkiri' n'afọ 2014 maka ihe o mere n'ihe nkiri '12 Years a Slave'
  • Sophia Okonedo bụ nwaafọ Naịjirịa a mụrụ na Britain so na ndị a kpọrọ aha inweta ihe nrite 'nwaanyị kacha akwado ihe nkiri' n'afọ 2005 maka ihe o mere n'ihe nkiri 'Hotel Rwanda.'
Akara ntụ-ntụ