'Afrịka ga-akọ akụkọ ndị Afrịka' - Mo Abudu

Ebe foto si, EbonyLife/Sony
Ihe ọhụrụ na-abịa n'ụlọọrụ ihe nkiri nke EbonyLife TV.
Akụkọ sị ụlọọrụ a kwuru na Ebony Life na Sony TV, bụ ụlọọorụ ihe nkiri nke ala bekee, ebinyeela aka n'akwụkwọ maka imekọ ihe n'ime ọrụ ihe nkiri.
N'ime akwụkwọ ozi Ebony Life zipuru ndị ntaakụkọ, ha kwuru na nke a bụ nke mbụ ụlọọrụ ihe nkiri nke ala Naijirịa na Sony ga-ebinye aka na akwụkwọ imekọ ihe.
Ihe a pụtara na Ebony na Sony ga-ebido ihe nkiri dị icheiche. Ha kwuru na ugbua a mụpụtala ihe onyonyo atọ nke ọhụrụ. Otu n'ime ihe nkiri a nke akpọrọ 'Dahomey Warriors' na bekee.
Onyeisi Ebony Life bụ Mo Abodo kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na kemgbe amụpụtara ụlọọrụ Ebony Life n'afọ 2013, ihe kachasị dị ya mpka bụ ị gbanwee etu ala ndị ọzọ sịrị hụ mba Afrịka.

Ebe foto si, Ebony Life
O kwuru, "Ihe m chọrọ bụ ka anyị bụ ndị ụmụafọ Afrịka bụrụ ndị ga-akọ akụkọ anyị ka anyị sịrị chọ."
Akụkọ ga-amasị gị
Mo kwuru na obi na-atọ ya ụtọ, na akụkọ di icheiche sị mba Afrịka ga-erute mba ụwa niile maka mbinye aka a mere.
Uru o nyere Nollywood
Nollywood bụ otu na-eme ihe nkiri gbasara Naịjirịa na Afrịka nke amaama na mba ụwa.
Ụlọọrụ dịka Ebony Life TV enyeela otu a n'ịkwado nke ọma, makana ọtụtụ ihe nkiri amụpụtara mere ka ụwa mara maka Nollywood nke oma, dịka ihe nkiri 'Wedding Party', 'Fifty na Royal Hybiscus Hotel'.

Ebe foto si, Getty Images
Wedding party na Royal Hybiscus Hotel pụtara na mmemme gbasara ihe nkiri ha na-eme na Toronto n'obodo Canada.
Na afọ 2014, gọọmentị Naịjirịa kwuru na Nollywood bụ otu ruru ijeri dọla atọ.
Ọrụ ka dị
Ndị ohi akpọrọ pirates na bekee ka na-emebi ọrụ ndị ihe nkiri na Nollywood. Otu akpọrọ National Bureau of Statistics deree na sọọsọ otu percent n'ime ijere dọlas atọ na ba aka ndị nwere ihe nkiri a.









