Kenneth Okonkwo: Enugwu steeti nọ n'agbụ ugbua

Kenneth Okonkwo

Ebe foto si, @realkenokonkwo

Nkọwa foto, Kenneth Okonkwo na-azọ gọvanọ Enugwu n'okpuru pati APC

Onye na-eme ihe nkiri bụ Kenneth Okonkwo nke e ji "Andy Okeke" mara ekpebiela na ya ga-azọ ọchịchị ọkwa Gọvanọ Enugwu steeti n'afọ 2019.

Kenneth bụ onye Nsukka dị n'Enugwu gwara BBC Igbo na ọ bụ mmasị ya ime ka Enugwu steeti ga n'iru dịka ọrụ nkiri ha bidoro na Naịjirịa si gaa n'iru.

Kenneth so na ndị mere ka ọrụ nkiri Naịjirịa bụrụ ihe na-ewuewu na mba ụwa dịka o sonyere na ihe nkiri e mere n'asụsụ Igbo a kpọrọ, "Living in Bondage".

Kenneth Okonkwo kọwara BBC Igbo na ihe nkiri ọ na-eme bidoro ka ihe egwuregwu na ihe iji nwe aṅụrị na abụghị akaọrụ mana ọ gara nke ọma bụrụ ihe mepụtara ihu Naịjirịa.

O kwuru na dịka ya siri ga n'ihu n'ọrụ nkiri ka ya siri chọọ ime ka Enugwu steeti gaa n'ihu.

Kenneth katọrọ ọchịchị Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi bụ aka na-achị Enugwu steeti kwuo na ndị Nsukka anaghị enwe aṅụrị n'ọchịchị ahụ.

Ọ gwara BBC Igbo na nanị afọ anọ ka ya chọrọ ịchị.

Aha onyonyo, Kenneth na-azọ ọchịchị na pati APC

Ọ na-azọ ọchịchị n'okpuru pati ndị APC.

Akara ntụ-ntụ

Akụkọ ndị ga-amasị gị:

line

Ihe ndị ị na-amaghị maka Kenneth Okonkwo

1. Ọ bụ onye Nsukka dị n'Enugwu steeti.

2. O mere agwa Andy Okeke n'ihe nkiri a na-akpọ "Living in Bondage" nke e mepụtara n'afọ 1992.

3. Ọ bụ onye ọkaiwu, ọ gụrụ akwụkwọ na mahadum UNN nakwa UNILAG.

4. Ọ lụrụ nwa ụkọchukwu ya n'afọ 2000 mana ha gbara onwe ha alụkwaghị m n'afọ 2002.

5. Ọ mụrụ ọkpara ya n'afọ 2016 ka ọ gasịrị afọ itoolu ọ lụrụ nwunye ya nke abụọ bụ Ifeoma Okonkwo.

line

Kenneth esonyela ndị na-eme onyonyo bara ndọrọndọrọ ọchịchị

Kenneth na-ekele Sullivan

Ebe foto si, @realkenokonkwo

Nkọwa foto, Kenneth nwere nkwado aka chịburu Enugwu bụ Sullivan Chime

Ndị na-eme ihe nkiri na Nollywood dịka Desmond Elliot, Kate Henshaw na ọtụtụ ndị ọzọ esirila na ihu TV banye ọrụ gọọmenti na steeti ha dị icheiche.

Kenneth Okonkwo gwara BBC Igbo na ya nwere ntụkwasị obi na ndị Enugwu ga-akwado ya dịka aka chịburu Enugwu Sullivan Chime kwadoro ya.

N'aka nke ọzọ, onyeisi pati APC n'Enugwu steeti bụ Ben Nwoye kwuru na Kenneth pụrụ imeri ntuliaka n'afọ 2019.

Gọvanọ Ifeanyi Ugwuanyi nọ pati PDP dịka ọchịchị ya ugbua bụ nke mbụ.