Uweojii: Kwụsinụ i nata ndị ụnụ amaghị enyemaka

Ebe foto si, AFP
Ụlọọrụ uweoji dị na Enugu anwụchiela onye mara maka izu ohi na ATM na Enugu ma na gburugburu ya.
Onye na-ekwuchitere ndị uweojii ọnụ n'Enugu steeti bụ Ebere Amaraizu kwetere taa na-anwụchịrị ya bụ omekome n'ụbọchị Febrụwarị iri asaa na-ebe elekere iri na otu na atọ.
Amaraizu kwuru na-enwudere ya bụ onye a na-enyoenyo na ATM dị na Rangers Avenue n'Enugu ebe o ji kadị isi eji a dọrọ ego bụ nke ndị mmadụ.
O kwuru na onye a ana-enyoenyo nyere aha ka Augustine Nwoko bi na 34 Carta Street,ogui, Enugu gwara ha na o na-eji aghụghọ awakpo ndị arụrụana ya metụtara.

Ebe foto si, Amaraizu
"Ha na-eji na ha chọrọ inyere ndị mmadụ aka dọrọ ego na ATM nara ha akara ha ,zuo ha oshi.
"Tupu imara ihe na-eme nụ ha kpiri akara njiri mara onye,nyeghachi gị kadị ATM yiri nke onye ahụ".
"Ha ejiri zie nwayọ dọkọrọ ego niile dị na akaunt onye ahụ"
Amaraizu were ohere a wee kọwapụtara BBC Igbo ụzọ ole ma ole mmadụ nwere ike ị gbanahụ ndị ohị ATM:
Mgbe agbara Nwoko ajụjụ ọnụ,okwu kwara na osonyere otu na-anọ akụkụ ATM,ghọria ndị mmadụ ka ha che na ha na-enyere ha aka i dọrọ ego.
Amaraizu dụrụ ndị mmadụ ọdụ ha kpachapụ anya maka emume ndị omekome ndị na-abiakụte mmadụ ka agasi na ha chọrọ i nyere ha aka.









