Abaribe: Ihe DSS jiri kpọchịe m'
Onye omeiwu na-anọchi anya mpaghara ndịdị anyanwụ Abia Steeti bụ Enyinnaya Abaribe ekwuola ihe mere ndị ụlọọrụ nchekwa puruiche eji DSS mara ji nwụchie ya.
O kwuru na ọ bụ n'ihi ndọrọndọrọ ọchịchị riri unyi nke Pati All Peoples Congress (APC) na-eme.
Abaribe kwuru ihe a unyaahụ n'isi ụlọọrụ ndị otu pati People Democratic Party (PDP). Ọ rụtụrụ aka na ndị ụlọomeiwu niile nọ zi n'ihe ize ndụ maka nta ndị isi ọchịchị na-achụso ha.
O kwuru na etu ụlọọrụ INEC ga-esi rụọ ọrụ na ntuliaka 2019 bụ ihe ga-egosi ma Naịjirịa ọ ga-adịgide na ngwụcha ntuliaka ahụ.
N'okwu ya "Ihe niile ha na-eme ugbua bụ i yi ndị mmadụ egwu, ịhụ na ha mechiri ọnụ ndị na-ekwu okwu megide ha.
"Ụlọomeiwu bụ nke m so n'ime ya bụ ebe ha na-awakpo, e si na nke onyeisi ụlọomeiwu baa na nke Sịnetọ Melaye rue na nke Shehu Sani, ugbua bụ nke m".
Abaribe gara n'ihu si: "Ihe m nwereike ị gwa ndị Naịjirịa bụ ka onye ọbụla jide akwụkwọ nbianye aka ị chụpụ gọọmentị na-achị ugbua".
"Gọọmentị a bụzi maka mmegbu ndị mmadụ, onweghi ụzọ ọzọ enwereike iji mme ya".
Abaribe kwuru na anwụchiri ya ma nyocha ụlọ ya n'ahi na ọ bụ onye nkwado ndị na-eyi ndụ egwu.
O kwuru na onye dị njikere na gọọmentị ga-achọ otu ihe konye gị n'isi iji mebie aha gị.
BBC Igbo na Abaribe nwebụruụ mkparitaụka n'afọ a, ebe ọ nọ kwuo na ndị Igbo na ewere gọọmenti etiti iwe maka agwa ọjọ ha che na a na-akpasi ha.
Gee okwu ya ebe, nakwa n'elu.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:












