Nwụchị Abaribe: Ihe otu Ipob kwuru maka nwụchị ya

Eyinnnaya Abaribe

Ndị otu IPOB etinyela ọnụ n'ihe gbasara nwụchi omeiwu Enyinnaya Abaribe.

Ọnụ na-ekwuchitere ha bụ Emma Powerful kwuru sị na ọ bụ maka ihe gbasara IPOB ka e ji nwụchie ya, maka na gọọmentị etiti na-achọ 'ịgbọchi ndị Igbo ọnụ'.

O kwuru sị tọghapụ ya ozugbo ozugbo.

Ipob rịọrọ ndị gọọmentị mba ofesi ka ha gbatara ha ọsọ enyemaka sị ha tinye ọnụ n'okwu a gbasara Abaribe na gọọmentị etiti.

Ha kwukwara na onweghị ihe ga-eme ka ha kwụsị ọchịchọ Biafra.

N'aka ọzọ, otu akpọrọ 'World Igbo congress' kpọkuru gọọmenti etiti ka ha tọghapụ Abaribe na-etinyeghị ọnọdụ ọbụla.

N'akwụkwọ onyeisi otu ha bụ Anthony Ejiofor binyere aka, ha kwuru na ha hụtara nwụchi a dika ụzọ gọọmenti etiti si ekechi ndị na-akwadoghị ha ọnụ.

Cheta na Ohaneze Ndigbo rịọrọ ndị okaikpe Naịjirịa ka ha ghara ime dịka ndị "gọọmentị etiti Naịjiria na-eji aka ike na-emegbu ndị Igbo" na Naịjirịa.

Ohaneze Ndigbo n'ime akwụkwọ ozi a gbasara ndị ntakụkọ, kọwara na ha kwuru ihe a maka nwụchị ndị DSS nwụchịrị omeiwu na-anọchị anya Abia saụt bụ Eyinnaya Abaribe.

Ha si na ha kwusiri ike n'ihe a mere makana ndị DSS na-achọ onyeisi ndị otu Biafra bụ Nnamdi Kanu bụ onye Abaribe gbaara akaebe.

Cheta na ụnyaahụ, Ohaneze kwuru na Abaribe emeghi njọ ịgbara Kanu akaebe, nakwa na ọ bụ ndịagha Naịjirịa bụ ndị kwesiri ịchọpụta Kanu, na ọbụghị Abaribe.

Onyeisi ndị otu a bụ Nnia Nwodo, kwuru n'ime akwụkwọ ozi a na ọ dị mkpa ka onye ọbụla cheta na ọ bụ mwakpo ndịagha wakporo ụlọ Kanu n'Umuahia mere ka ọnọdụ Kanu jiri gbagwojuo anya.

Nwodo gakwara n'ihu sị na "ọ bụ sọọsọ ndị agha Naịjirịa nwere ị chọpụta ebe Kanu nọ ugbua. Makana ihe mere n'Umuahia ụbọchị ahụ bụ agha"

Nwodo kwukwara na ụbọchị a wakporo be Kanu, na o nwere ike ịbụ na ọ nwuru maọbụ na ọ nwụghị.

Ohanaeze kwuru na ha na-arịọ ndị okaikpe ka ha kwụsị mmegbu ha na-emegbu ndị Igbo na kwa ka ha gba mgbo hu na a hapụrụ Abaribe kpam kpam.

Ndị na-akwado Biafra

Ebe foto si, Getty Images

Nkọwa foto, Ndị otu Biafra ahụbeghi onye isi ha Nnamdi Kanu ka mgbe Seputemba 2017

Cheta otu pati na-anọghi na ọchịchị nke a kpọro Peoples Democratic Party (PDP) na Bekee etinyere ọnụ na okwu nwụchị a ndị ngalaba nchekwa a kpọrọ DSS nwụchịrị onye na-anọchịte Abia Saụt na ụlọomeiwu ukwu.

Site na ozi ha gbasara, ndị PDP kwuru na etu e siri nwụchie Abaribe dị ka etu e si anwụchi ndị echere na ha kpara mkpamkpa, bụ ihe ha che na ọ na-agba ama etu pati na-achi bụ All Progressives Congress (APC) siri chọọ ime ndị akwụnyeghị n'azụ ndọrọndọrọ ọchịchị 2019 nke onyeisiala Muhammadu Buhari.

Ha gakwara n'ihu kwuo na nwụchịkọ Abaribe bụ ụdịrị agwa Buhari n'ọchịchi ya chọrọ ịkpasị ndị "nọ na ụlọomeiwu ọnụ ha na ada ụda, ọkachasi etu osiri metụta ebe o na ada iwu obodo".

Cheta na ndị DSS nwụchịrị Abaribe n'Abuja tata mana a mabeghị ihe ha jiri mee nke a.

Cheta na Abaribe bụ onye kwụnyere Nnamdi Kanu dịka onye akaebe ị ji gbapụta ya n'ụlọịkpe

Abaribe nọ n'ebe ọ na-akpụ isi n'Abuja mgbe ndị uweojii a pụrụiche nwụchiri ya.

BBC Igbo na-agba mbọ ị nweta ụfọdụ ndị ụlọọrụ ndị uweojii pụrụ iche bụ DSS ị mata ihe ha ji nwụchie ya.

Abaribe bụ Sinetọ na-anọchị anya Abịa-Saụt n'ụlọomeiwu kwuru n'ọnwa Eprelu na ndị ọchịehi na-achọ ị nara ụmụ Igbo ala ha

Lee ihe onyonyo ebe o kwuru nke ahụ ebe a.

Aha onyonyo, Mkparịtaụka ebe Sinetọ Abaribe kọwapụtara iwe ndị Igbo ebe onyeisiala Muhammadu Buhari nọ.
Aha onyonyo, Okwu Abaribe kwuru banyere ndị ọchị ehi.
Presentational grey line

Akụkọ ga-amasị gị:

Presentational grey line