Okwu Chimamanda maka asụsụ Igbo etinyela ọkụ na Soshal midia

Soshal media na-akpọtụ na Naịjirịa kemgbe nwanne ụnyaahụ maka okwu ada Igbo bụ Chimamanda Adichie kwuru na mkparịtaụka ya n'ụlọ ntaakụkọ New Yorker nwere.
N'ime mkparịtaụka ahụ, ka Adichie na aza aziza banyere etu o siri ahu asụsu Igbo na ụjọ ọ na-atụ na ya bụ asụsụ na-anazị ana, o kwuru na ndị Igbo toro na Legọs anaghị achọ ịsụ Igbo.
"Onyere ihe m na-akpọ, na mmegbụ o, ihere Igbo," Chimamanda kwuru. "Ndigbo toro na Legọs na-agbara ịgbo ha ọsọ. Ị hụ ha n'ezi were gwa ha okwu n'Igbo, ha agaghi aza gị n'Igbo."
Okwu a, bụ nwaọbere ọkwụ ka ụwa dọgidere aka n'ime akukọ niile edere na ya bu mkparịta ụka n'tụtụ taa.
Na Twitter, enwere ndị kwere n'ihe Adichie kwuru, ma kwuo n'eziokwu:
Nicholas Ibekwe bu onye ntaakụkọ kwuru na enwere eziokwu di na okwu Chimamanda:
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 1
@Tokwonna kwuru na-ebe ọ nọ, na ya bụ akụkọ dị mma maka ọ na-egosi ndị mmadụ na-akwadozi asụsụ Igbo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 2
@Tokwonna gakwara n'ihu sị na Adịchie bụ "efele nkụwa nke Igbo"
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 3
@edumontee kwuru sị ka ahapụ Adichie aka maka ọtụtụ ndị na-ako ya ọnụ bụ ndị akpọgara ala Igbo ha ga mụọ Igbo.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 4
@Omojuwa, bụ onye ama ama na Twitter kwuru na ọbụghị ihe Adichie kwuru na-ese okwu, na onwere ihe ọzọ mere ndị mmadụ jị ewere ya iwe.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 5
Mana, onwere ndị ekweghị na okwu Chimamanda kwuru.
@tomisanokomi kwuru na ihe Adichie kwuru adabaghị ma chaa, maka na ndị Igbo ọ ma adịghị eme otu a.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 6
@reminola kwenyere n'ihe okwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 7
@Duks_OG kwuru n'ebe ya na-arụ ọrụ, ndị Igbo na-asụ asụsụ ha, nke mere ya ejighị kwenye n'ihe Adịchie kwuru.
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post, 8
Ka okwu a na-ada, ihe ndi mmadu ga na-ajụ bụ kedu nke bụ eziokwu.