Chimamanda kwuru na a wakporo ya n'ike oge ọ bụ agbọghọ

Onye ode akwụkwọ a ma ama na Naịjirịa bụ Chimamanda Ngozi Adichie, kwuru na e nwere nwoke a ma ama n'ihe gbasara ntaakụkọ nwakporo ya n'ike mgbe ọdị afọ 15.
O kwuputere ihe a na Stockholm Forum ebe ọ gara ọgbakọ e mere maka ikwu maka nhatanha nwoke na nwaanyị.
Adichie bụ onye kwuru okwu mmechi n'ọgbakọ ahụ, kọwara na ihe a mere mgbe o dere akwụkwọ mbem ọ chọrọ ibiputa. O nyere otu nwoke ọ sị na ọ bụ "nnukwu mmadụ na ntaakụkọ" akwụkwọ a maka na o chere na ọ ga-enyere ya aka mee ka ndị mmadụ mara maka akwụkwọ ya.
Ọ kọwara etu nwoke a si manye aka n'okpuru akwa ya wee pịa ya aka n'obi. Ihe a mere nwoke ahụ ka gwachara ya na ọ bụ nnukwu ihe na o dere akwụkwọ ahụ o dere.
Ọ sị: "Obi mapụrụ m nke ukwuu mere na m enwenwughị ike ime ihe ọbụla n'ihe ruru ntabianya otu maọbụ abụọ, mana enwetara m onwe m, wee jiri nwayọ kpachapụ aka ya, makana achọghị m ikpasu ya iwe."
"E mechara oge ahụ, ihe were gbakasịa m n'ihu, olu na obi, ọ dị ka ahụ m ọ na-akụja, dị ka ọ na-ekwu ihe ọnụ m ekwunwughị," Adichie kwuru.
Lee onyoyo mgbe Chimamanda kwuru maka "feminism" ebe:







