Kwụsịnụ ịta Chidoka na Abaribe amusu maka Nnamdi Kanu - IPOB

Ebe foto si, Getty Images
Ndị otu akpọrọ Indigenous People of Biafra, IPOB, n'ichafụ agwala gọọmentị etiti ka ha kwụsị amusu a na-ata onye bụbu onyesisi n'ihe gbasara njem ụgbọelu, Osita Chidoka na Sinetọ Enyinnaya Abaribe bụ onye na-anọchite Abia Saụt na sineti.
Abaribe na Chidoka bụ ndị tinyere onyeisi IPOB bụ Nnamdi kanu aka n'akwụkwọ nnaputa.
N'akwụkwọ onye na-ekwuchitere IPOB ọnụ bụ Emma Powerful depụtara, o kwuru na onye ọbụla si na pati APC maọbụ ndị otu ọchịchị gọọmentị etiti na-emegide ndị na-akwado Nnamdi Kanụ achọghị ọdimma obodo Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
Powerful kwukwara n'akwụkwọ ahụ na ọ bụ ihe mwute na onye ọbụla na-akwado Nnmadi Kanu nọ na mmegbu.
Ọ sị na ọ bụ ihe na-agbawa obi na Chidoka na Abaribe ga na-ata ahụhụ makana ha na-akwado onyeisi IPOB.
N'ọnụ ya, "Amusu a na-ata Chidoka na Abaribe kwụsị ugbua ma ọ bụrụ na ndị APC achọghị nsogbu.
Anyi agaghị awakpo onye ọbụla mana ọ bụrụ na gọọmentị etiti chere na ha ga na ata ndị Igbo ahụhụ na nkịtị, ha na agaghie ụzọ.''

Ebe foto si, Getty Images
"IPOB achọghị ịma maka ihe na-eme na ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa mana anyị agaghị anọ na-elele ka a na-emegbu nwafọ ọwụwa anyanwu ọ bụla site n'iji EFCC majaa ha".
Ọ jụkwara n'akwukwọ ahụ ihe kpatara na anaghị akpatụ onye Fulani ọbụla so na mmerụaka aka mana a ga-anwụchị ụmụ Igbo were ha na-eme ihe akaja maka na ndị Igbo enweghị ọnụ okwu n'ihe gbasara ndọrọndọrọ ọchịchị Naịjirịa.

Ebe foto si, Getty Images
O kwuru na IPOB agaghị anabata agwa ọ bụla gosiri na-achọrọ ịnapụ ike nnọchite anya nke Sinetọ Abaribe.
"Anyi na-agwa ndị ji ọchịchị Muhammadu Buhari ka ha buru ọgụ ha na-aluso mpụ na mmerụaka gawa n'ugwu makana ọ bụ ebe ahụ ka ya bụ ndị na-eme mpu karịrị akarị."

Akụkọ ndị ga-amasị gị:











