Ndị agha Naịjirịa ebusola Boko Haram agha na Maiduguri

Ebe foto si, Getty Images
Akụkọ na-eru anyị ugbua na-ekwu na ndị agha Naịjirịa na ndị agha Boko Haram na-ebuso onwe ha agha ugbua n'obodo Maiduguri na Borno steeti.
Ndị bi na-ebe akpọrọ Jiddari Polo na Maiduguri kwuru na ha na-anụ ụda egbe oge ikpe ekpere bidoro n'abalị a.
Ha kwukwara na obi amapuola ọtụtụ mmadụ bi na mpaghara ebe ahụ.
Ndị ntaakụkọ AFP kwuru na ndị agha Boko Haram jiri nnukwu ngwa agha bata na bee ndị agha Naịjirịa n'ike, maka ị zọpụta ndị otu ha ndị agha Naịjirịa jichiri n'ebe ahụ.
O nwebeghi ihe ndị agha Naịjịrịa gwara ndị ntaakukọ ugbua maka ihe a n'eme na Maiduguri.

Ebe foto si, Getty Images
N'akụkọ yiri ibe ya, egbuola mmadụ 27 na Benue steeti ma sunye ọkụ n'ụlọ ekpere ndị otu alakụba abụọ.
Ihe a bụ ogbugbu ịji kwụghachị ụgwọ ndị ụkọchukwu abụọ uka Katolik na mmadu 16 ndị ochịehi jii egbe gburu n'ụbọchị ole na ole garaaga.
Ndị isi obodo ihe a mere ekwuola na ha ga-elị ndị nwụrụ taa.
Ndị uweojii kwukwara na udo alaghachịala azụ n'obodo ahụ.

Akụkọ ga-amasị gị:









