A ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo Benue steeti

Ebe foto si, Getty Images
Gọọmenti Benue Steeti ekwuola na ha ga-elikọta ndị nwụrụ na mwakpo ndị a na-eche na ha bụ ọchịehi wakporo obodo Omusu, nke dị n'Edumoga dị na gọọmentị obodo Okpokwu nke Steeti ahụ na mgbede Mọnde.
Ihe a na-eme ka Onyeisiala Naịjirịa bụ Muhammadu Buhari kwere nkwa ịga steeti ahụ na ebe ndị ọzọ ọgbaghara a na-ebo ndị Fulani na-achị ehi dị na Naịjirịa.
Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ ogbugbu mmadụ na-eme na Benue Steeti.
Na mbido afọ a, mwakpo emere na gọọmentị obodo abụọ gburu mmadụ 73 ma bute mmebi ụlọ na akụnaụba. Igbu mmadụ bụzị ihe na-eme mgbe niile na Benue kamgbe ahụ.
Mwakpo nke Mọnde merụkwara ọtụtụ mmadụ ahụ ma mee ka a na-achọ ụfọdụ ma ruo ugbua. Ndị mere mwakpo a gbakwara ụlọ, ọba nri na akụnaụba ndị ọzọ ọku.
Otu onye hụrụ mgbe mwakpo a mere na-akọwa na ọ bụ n'elekere anọ nke mgbede ka ndị omekome a wakporo obodo ma bido ịgba ihe ọbụla ha hụrụ egbe.
Gọvanọ na-achị Benue Steeti bụ Samuel Ortom so na ndị mbụ gara mgbaru n'obodo ihe a metụtara. Gọvanọ Ortom duuru ndị ọchịchị ya ịga hụ ihe mere.
Ọ gwara ndị Omusu na ndị a na-akpa ike si mba ofesi bata, ma kwukwa na-agaghị anabata ogbugbu mmadụ a ndị ọchi ehi na-eme.
O kwukwara na ọ bụ mmadụ 24 ka ha ma nwụrụ n'otu ụbọchị na mwakpo a.
Ortom sị ka ndị nchekwa nwụchie ndị isi Miyetti Allah, bụ ndị o na-ebo ebubo na aka ha dị n'ihe na-eme na Benue.
Ọ gakwara n'ihu kwuo na a ga-elikọta ndi nwụrụ na mwakpo a.
Olofu Ogwuche, bụ onye na-achị gọọmenti obodo ebe ihe mere, sị na ọgbaghara a bidoro mgbe ndị ọchịehi bịara gwa ya na ehi ha na-efu. Ọ sị na ọ bụ ka ọ na-enyocha ihe mere ka awakporo obodo ahụ.
Nsogbu ndị ọchiehi na ndị na-akọ ugbo so n'ezigbote nsogbu Naịjirịa nwere ugbua.
Onyesiala Buhari ezipụla ndị agha na ndị uweojii ka ha gaa ọrụ nchekwa n'ebe ihe a kachasị eme.

Akụkọ ndị ga-amasị gị:










